Isiokwu Ndị Dị n’Ụlọ Nche A
3 Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha na Madagaska
IZU NA-AMALITE NA FEBỤWARỊ 26, 2018 RUO MACH 4, 2018
7 “Ọ Na-eme Ka Onye Ike Gwụrụ Nwee Ike”
Olee ihe anyị nwere ike ime ma ike ụwa gwụ anyị? Isiokwu a kọwara isiokwu afọ 2018, ma kọwaa ihe mere anyị ga-eji kwe ka Jehova nye anyị ike, nakwa otú ọ ga-esi enye anyị ya.
IZU NA-AMALITE NA MACH 5 RUO 11, 2018
12 Ncheta Ọnwụ Jizọs Na-eme Ka Anyị Na-adị n’Otu
A ga-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs a na-eme kwa afọ na Satọdee abalị iri atọ na otu n’ọnwa Mach, afọ 2018. Olee otú anyị ga-esi akwado maka ya? Olee uru ọ ga-abara anyị ma anyị gaa ya? Oleekwanụ otú o si eme ka ndị Chineke n’ụwa niile na-adị n’otu? Ị ga-ahụ azịza ajụjụ ndị a n’isiokwu a.
IZU NA-AMALITE NA MACH 12 RUO 18, 2018
17 Gịnị Mere Anyị Ga-eji Enye Onye Nwe Ihe Niile Onyinye?
Ọ bụ Jehova nyere anyị ihe niile anyị nwere. Ma, ọ chọrọ ka anyị jiri ha na-akwado ọrụ nzukọ ya na-arụ taa. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe mere ọ ga-eji abara anyị uru ma anyị nye Jehova ihe ndị dị oké ọnụ ahịa anyị nwere, nakwa uru ọ ga-abara anyị.
IZU NA-AMALITE NA MACH 19 RUO 25, 2018
22 Olee Ụdị Ịhụnanya Na-eme Ka Mmadụ Na-enwe Ezigbo Obi Ụtọ?
IZU NA-AMALITE NA MACH 26, 2018 RUO EPREL 1, 2018
27 Ihe Dị Iche ná Ndị Na-efe Chineke na Ndị Na-anaghị Efe Ya
Isiokwu nke mbụ kọwara na ihe na-eme ka mmadụ na-enwe ezigbo obi ụtọ bụ ịhụ Chineke n’anya, ọ bụghị ụdị ịhụnanya a na-ahụ “n’oge ikpeazụ” a. (2 Tim. 3:1) Isiokwu nke abụọ kọwara otú àgwà ndị e ji amata ndị na-anaghị efe Chineke n’oge ikpeazụ a si dị ezigbo iche n’àgwà ndị Chineke na-akpa.
32 Ị̀ Maara?