Isiokwu Ndị Dị n’Ụlọ Nche A
IZU NA-AMALITE N’EPREL 30, 2018 RUO MEE 6, 2018
3 E Kwesịrị Ime Ndị Kraịst Baptizim
IZU NA-AMALITE NA MEE 7 RUO 13, 2018
8 Ndị Nne na Nna, Ùnu Na-enyere Nwa Unu Aka Ka O Ruo Ime Baptizim?
Olee ihe anyị kwesịrị iburu n’obi mgbe anyị na-amụrụ mmadụ Baịbụl? Gịnị mere ọ dịghị mma igbu oge ime baptizim? Gịnị mere ụfọdụ ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst ji agwa ụmụ ha ka ha cheretụ tupu e mee ha baptizim? A ga-aza ajụjụ ndị a na ndị ọzọ n’isiokwu abụọ a.
13 Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
IZU NA-AMALITE NA MEE 14 RUO 20, 2018
14 Ile Ọbịa Bụ Ihe Na-eme Obi Ụtọ Anyị Kwesịrị Ịna-eme
Pita onyeozi gwara Ndị Kraịst dịrị ndụ n’oge ndịozi Jizọs, sị: “Na-elenụ ibe unu ọbịa.” (1 Pita 4:9) Gịnị mere ihe a o kwuru ji dị mkpa n’oge anyị a? Olee ụzọ ụfọdụ anyị nwere ike isi lee ndị ọzọ ọbịa? Oleekwa otú anyị ga-esi bụrụ ezigbo ndị ọbịa? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu a.
19 Akụkọ Ndụ—O Nwebeghị Mgbe Jehova Hapụrụ M
IZU NA-AMALITE NA MEE 21 RUO 27, 2018
23 Chineke Na-adọ Anyị Aka ná Ntị Iji Gosi na Ọ Hụrụ Anyị n’Anya
IZU NA-AMALITE NA MEE 28, 2018 RUO JUN 3, 2018
28 “Nụrụnụ Ịdọ Aka Ná Ntị Wee Mara Ihe”
Isiokwu abụọ a ga-enyere anyị aka ịghọta na aka ná ntị Jehova na-adọ anyị na-egosi na ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. Ma, olee otú Chineke si adọ anyị aka ná ntị? Olee ihe anyị kwesịrị ime mgbe ọ dọrọ anyị aka ná ntị? Olee otú anyị ga-esi na-arụ ahụ́ anyị ụka ma ọ bụ na-ejide onwe anyị? Gụọ isiokwu abụọ a ka ị mata azịza ajụjụ ndị a.