Ịbụ Ndị Jehova Na-enyocha—N’ihi Gịnị Ka O Ji Baa Uru?
1 Onye ọ bụla na-achọ ahụ ike. Ọ na-eme ka ndụ dịkwuo nnọọ ụtọ. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị nwere ahụ ike na-enyochakwa ahụ ha site na mgbe ruo na mgbe. N’ihi gịnị? Ha na-achọ ịchọpụta nsogbu ahụ ike ọ bụla na-ebilite, ka e wee were nzọụkwụ ụfọdụ iji gwọọ ha. Ọ dị mkpa ọbụna karị ichebe ahụ ike ime mmụọ anyị. Nnwapụta Jehova dabeere ‘n’inwe ezi ndụ n’ime okwukwe anyị.’—Taịtọs 1:13.
2 Ugbu a bụ oge kwesịrị ekwesị iji bụrụ onye Jehova nyochara. Gịnị mere o ji bụrụ otú ahụ? N’ihi na Jehova nọ n’ụlọ ukwu ya dị nsọ, ọ na-enyochakwa obi mmadụ nile. (Abụ Ọma 11:4, 5; Ilu 17:3) Dị ka Devid, anyị na-arịọ Jehova ka o nyochaa anyị n’ụzọ zuru ezu: “Nwaa m, Jehova, nwapụtakwa m; nụchaa akụrụ m abụọ na obi m.”—Abụ Ọma 26:2.
3 Anyị aghaghị iche nche megide ihe ndị na-eyi ahụ ike ime mmụọ anyị egwu bụ́ ndị pụrụ isite n’ime anyị n’ihi anụ ahụ anyị na-ezughị okè. Ilu 4:23 na-adụ ọdụ, sị: “Karịa ihe ndebe gị nile chebe obi gị; n’ihi na site na ya ka mpụta nile nke ndụ dị.”
4 Ụwa rụrụ arụ, ma retọọ eretọọ bụ́ nke gbara anyị gburugburu pụkwara iyi ahụ ike ime mmụọ anyị egwu. Ọ bụrụ na anyị enye onwe anyị ohere ịgaru usoro ihe ọjọọ nke a oké nso, anyị pụrụ ịmalite iche echiche otú o si eche ma na-azụlite àgwà dị iche iche nke ụwa. Ma ọ bụ anyị pụrụ ịmalite ịgbaso ụdị ịdị ndụ nke ụwa, bụrụkwa ndị mmụọ nke ụwa meriri.—Efe. 2:2, 3.
5 Setan pụrụ iji mkpagbu ma ọ bụ mmegide kpọmkwem mee ihe ná mgbalị iji bibie anyị n’ụzọ ime mmụọ. Otú ọ dị, ọtụtụ mgbe karị, ọ na-eji ụzọ aghụghọ jiri ihe ndọrọ dị iche iche nke ụwa mee ihe iji rata anyị. Pita na-agba anyị ume ‘inwe anya udo, na-echekwa nche,’ ebe ọ bụ na Setan dị “ka ọdụm na-agbọ ụja . . . na-achọ onye ọ ga-elomi.” A na-agba anyị ume ‘iguzogide ya, na-anọgidesi ike n’okwukwe.’—1 Pita 5:8, 9.
6 E nwere mkpa nke ichebe ahụ ike ime mmụọ anyị site n’ime ka okwukwe anyị dị ike na site n’iwusiwanye ya ike kwa ụbọchị. Pọl onyeozi na-atụ aro ka anyị nọgide na-anwa okwukwe anyị. Dị nnọọ ka anyị na-eji amamihe aṅa ntị na ndụmọdụ dị irè nke onye dọkịta maara ọrụ nke ọma, anyị na-aṅakwa Jehova ntị mgbe nnyocha ime mmụọ Ya kpughere nsogbu nke dị mkpa ka e dozie. Nke a na-eme ka o kwe anyị omume ịbụ ndị ‘e mere ka ha zuo okè.’—2 Kọr. 13:5, 11.
7 Jehova bụ Onye Nnyocha ukwu ahụ n’ezie. Nchọpụta ya na-ezi ezi mgbe nile. Ọ maara kpọmkwem ihe dị anyị mkpa. Ọ na-enye nri ime mmụọ na-enye ahụ ike site n’Okwu ya na site ‘n’ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi.’ (Mat. 24:45; 1 Tim. 4:6) Iri nri ime mmụọ a na-edozi ahụ mgbe nile n’ebe obibi na ná nzukọ dị iche iche nke ọgbakọ na-enyere anyị aka ịnọgide na-enwe ahụ ike n’ụzọ ime mmụọ. Mmega ahụ chiri anya n’ụzọ ime mmụọ n’ozi ahụ na n’ihe omume ndị ọzọ nke ndị Kraịst bakwara uru. Ya mere, anyị na-anabata nnyocha chiri anya Jehova na-eme, na-enwe obi ike na ọ ga-edote anyị n’ahụ ike ime mmụọ kasị mma.