Na-emenụ Ihe Nile Ka E Wee Nye Chineke Otuto
1 Lee ihe na-enye ume ọhụrụ ọ bụ iso ezi ụmụnna anyị ndị nwoke na nwanyị na-akpakọrịta! (1 Kọr. 16:17, 18) Anyị naeme nke a ná nzukọ, ná mgbakọ dị iche iche, na n’ozi ubi. Anyị na-akpakọrịtakwa n’oge ndị a na-eyighị eyi, dị ka mgbe anyị nwere ndị ọbịa n’ebe obibi anyị. N’ime nke ahụ, anyị na-egosi ile ọbịa nke ọma, na-agbakwa ibe anyị ume. (Rom 12:13; 1 Pita 4:9) Mgbe a na-eme nhazi oriri agbamakwụkwọ, buru n’uche ndụmọdụ ọma ahụ dị n’Ụlọ Nche nke October 15, 1984.
2 Nnọkọ Oriri na Ọṅụṅụ A Haziri Ahazi: Ma anyị ‘na-eri ihe, ma anyị na-aṅụ ihe, ma anyị na-eme ihe ọ bụla,’ anyị kwesịrị ‘ime ihe nile ka e wee nye Chineke otuto.’ (1 Kọr. 10:31-33) Ụfọdụ adịghị aṅa ntị na ndụmọdụ a, nsogbu nọgidekwara na-ebilite n’ihi nnọkọ oriri na ọṅụṅụ ndị buru ibu nke na a pụghị ịchịkwa ha nke ọma, dị ka nnọkọ oriri agbamakwụkwọ. N’ọnọdụ ụfọdụ, a na-akpọ ọtụtụ narị mmadụ òkù n’oké nnọkọ oriri na ọṅụṅụ ebe e jiri ntụrụndụ ndị ụwa mee ihe. O mewo n’ebe ụfọdụ na a kpaliri ndị bịaranụ iji ego gbanwere mkpụrụ ọjị. Nnọkọ ndị dị otú ahụ na-eyi nnọọ nnọkọ oriri na ọṅụṅụ nke ụwa, nke mmụọ ya na-ekwekọghị n’ịdị mma n’anya na ụkpụrụ dị iche iche nke Bible.—Rom 13:13, 14; Efe. 5:15-20.
3 E nyewo akụkọ na ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke Ndịàmà agbakọtawo n’ihe owuwu ndị a kwụrụ ụgwọ ha ebe ntụrụndụ a na-enwe na-adịghị mma ma nwee ọdịdị nke ụwa, na ebe a na-enweghị nlekọta kwesịrị ekwesị. Ihe omume ndị yiri ya a na-akpọsa dị ka ememe agbamakwụkwọ ọdịnala nke “Ndịàmà Jehova” abụrụwo ndị e mere na họtel ma ọ bụ n’ebe ntụrụndụ dị iche iche. N’ihi ihe isi ike dị n’ilekọta nnukwute ìgwè ndị dị otú ahụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị, nsogbu dị iche iche ebilitewo. Oké mkpọtụ, ịṅụbiga ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ókè, na ọbụna omume rụrụ arụ esiwo na ya pụta mgbe ụfọdụ. (Efe. 5:3, 4) Nnọkọ oriri na ọṅụṅụ ebe àgwà ndị dị otú ahụ na-ewere ọnọdụ adịghị ewetara Jehova nsọpụrụ. Kama nke ahụ, ha na-ewetara aha ọma nke ọgbakọ nkọcha, na-emekwa ka ndị ọzọ ma n’ọnyà.—1 Kọr. 10:23, 24, 29.
4 A na-agba ndị Kraịst ume ile ọbịa nke ọma, ma ihe e kwesịrị ilekwasị anya na ya bụ mgbanwerịta nke ihe ime mmụọ. (Rom 1:11, 12) Nnọkọ ndị dị ntakịrị na-aka nnọọ mma. Akwụkwọ Ozi Anyị na-ekwu na peji nke 135-136, sị: “Mgbe ụfọdụ, a pụrụ ịkpọ ezinụlọ ụfọdụ òkù n’otu ebe obibi maka nnọkọrịta ndị Kraịst. . . . Dị ka ndị nwere ezi uche, ndị na-ele ọbịa n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ kwesịrị ịmara na ihe e mere ebe ahụ dị ha n’isi. N’iburu nke a n’uche, ndị Kraịst nwere nghọta ahụla amamihe nke ibilata ọnụ ọgụgụ ìgwè ndị dị otú ahụ na agbata oge nnọkọ ndị ahụ.” Jisọs gosiri na ọtụtụ ihe adịghị mkpa mgbe ihe mgbaru ọsọ anyị bụ ịgba ndị enyi anyị ume n’ụzọ ime mmụọ.—Luk 10:40-42.
5 Ọ bụ ihe dị mma ile ndị Kraịst ibe anyị ọbịa nke ọma. Otú ọ dị, e nwere ọdịiche dị ukwuu n’etiti nnọkọ na-ebubigaghị ibu ókè n’ebe obibi anyị na oké nnọkọ oriri na ọṅụṅụ na-egosipụta mmụọ nke ụwa n’ihe owuwu a kwụrụ ụgwọ na ya. Mgbe ị na-akpọ ndị ọzọ òkù ịbụ ndị ọbịa gị, i kwesịrị ijide n’aka na ị pụrụ ịza ajụjụ n’ụzọ zuru ezu maka ihe na-ewere ọnọdụ.—Lee Ụlọ Nche nke August 15, 1992, peji nke 17-20.
6 N’ezie, Jehova ejiriwo òtù ụmụnna gọzie anyị, bụ́ nke anyị na-esi na ya enweta agbamume na-enyeghachi ume nke na-akpali anyị ịga n’ihu n’ọrụ ọma dị iche iche. (Mat. 5:16; 1 Pita 2:12) Site n’igosipụta imeru ihe n’ókè na ezi uche ná nnọkọ oriri na ọṅụṅụ, anyị ga na-ewetara Chineke anyị otuto mgbe nile, na-ewulikwa ndị ọzọ elu.—Rom 15:2.