Ịgachi Nzukọ Anya Dị Mkpa Nye Nguzosi Ike Anyị
1 Pọl onyeozi gbara anyị ume ịnọgide ‘na-enwe ezi ndụ n’ime okwukwe anyị.’ (Taịtọs 1:9, 13) Ná nzukọ dị iche iche nke ọgbakọ anyị na-atụle echiche ndị ziri ezi, a na-enyekwa anyị ntụziaka n’ụzọ isi jiri ihe agha ime mmụọ kpuchie onwe anyị n’ụzọ zuru ezu ka anyị wee nwee ike “iguzogide ihe nile ekwensu na-ezupụta.”—Efe. 6:11; Fil. 4:8.
2 Nzukọ Na-enye Ihe Dị Anyị Mkpa: Ịgachi nzukọ ọgbakọ anya dị mkpa nye nguzosi ike anyị. (1 Kọr. 16:13) Ná nzukọ dị iche iche a na-ekpe ekpere iji kelee ma too Chineke, tinyekwara ịrịọ ya arịrịọ maka ọdịmma ọgbakọ na mkpa ya dị iche iche. (Fil. 4:6, 7) Isonye n’abụ Alaeze na-ewuli anyị elu ma na-eme ka anyị nwee ike ikwupụta mkpali na echiche anyị ka anyị na-efe Jehova ofufe. (Efe. 5:19, 20) Mkpakọrịta anyị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze tupu na mgbe nzukọ gasịrị na-agba anyị ume, na-ewuli anyị elu, na-enyekwa anyị ume ọhụrụ.—1 Tesa. 5:11.
3 N’April gara aga, okwu ihu ọha pụrụ iche, bụ́ “Ọgwụgwụ Okpukpe Ụgha Dị Nso” mere ka ịdị ngwa nke ime ihe n’egbughị oge iji si na Babilọn Ukwu ahụ pụọ bamisie ike n’uche ndị hụrụ eziokwu n’anya. (Mkpu. 18:4) N’ime June na July, lee ka o si bụrụ ihe na-akpali akpali ịmụzu isiokwu atọ nke ọmụmụ ihe Ụlọ Nche ahụ banyere mgbukepụ nke ìhè bụ́ nke nwuworo ìhè n’okporo ụzọ nke ndị ezi omume! (Ilu 4:18) Cheedị echiche ihe gaara efunahụ anyị ma a sị na anyị leghaara ịga nzukọ ndị ahụ anya.
4 Dị ka Nhazi E Mere Iji Jezuo Ozi Anyị na-arụtụ aka na peji nke 72, Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke bụ ndokwa maka ọzụzụ na-aga n’ihu nke ọgbakọ dum. Anyị apụghị ikwe ka ọzụzụ a funahụ anyị.
5 Nzukọ Ije Ozi anyị na-akwadebe anyị ịdịkwu irè n’ozi. E gosiri nke a site ná nzukọ nke anyị nọ n’ime ya nara ntụziaka maka ikere òkè ná nkesa sara mbara nke Akụkọ Alaeze nke 34. Ngọzi Jehova n’ọrụ a bara ụba, dị ka a na-ahụ n’ihe ndị pụrụ iche ọ na-arụpụta n’ụwa nile. (Tụlee 2 Ndị Kọrint 9:6, 7.) A gbara ndị na-agachi nzukọ anya ume, ha nyekwara aka ịmalite nkwado nke e nyere mkpọsa ahụ.
6 N’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ, a na-eme ka echiche nke ịdị ngwa anyị dị elu site n’ihe ndị anyị na-amụta n’Okwu Chineke site n’enyemaka akwụkwọ Mmezu Mkpughe. Ka ihe omume dị iche iche na-aga oké ngwa ngwa n’ọnọdụ ụwa, ọ dị anyị mkpa ịghọta mmezu nke amụma ndị ka mie emi nke Mkpughe.
7 Na-ebute Ịgachi Nzukọ Anya Ụzọ: N’ọtụtụ ala ebe a na-anwa ụmụnna anyị ọnwụnwa, ha nọgidere na-aghọta ókè ọ dị ha mkpa ịbịakọ ọnụ kwa izu. Dị ka ihe atụ, na Burundi, Rwanda, Liberia, Bosnia na Herzegovina, ọtụtụ ndị ọhụrụ na-abịa nzukọ nke na ha na-eji okpukpu abụọ ma ọ bụ ọbụna atọ karịa ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa na-abịanụ. N’ụzọ dị otú a, Jehova na-enyere ụmụnna ndị ahụ aka ịnọgide na-eguzosi ike n’otu mmụọ.—Fil. 1:27; Hib. 10:23-25.
8 Onye ọ bụla nke nọworo na-eleghara ịgachi nzukọ anya kwesịrị ime ihe ugbu a iji dozie ọnọdụ a. (Ekli. 4:9-12) Iji wee guzosie ike, ọ dị anyị mkpa isoro ndị tozuru okè na-akpakọrịta, dị ka ịgachi nzukọ anya na-enye ohere ya.—Rom 1:11.