Idozi Esemokwu n’Ịhụnanya Ndị Kraịst
1 Akwụkwọ ozi Jemes, n’isi nke 4, amaokwu nke 1, na-ajụ ajụjụ, sị: “Olee ebe ibu agha si bịa, olee ebe kwa ịlụ ọgụ si bịa, bụ́ nke dị n’etiti unu?” Ọ zara n’ụzọ doro anya na o sitere n’agụụ anụ ahụ maka ịdị mkpa ma ọ bụ ọchịchọ ịpụta ìhè karịa ndị ọzọ. N’ụzọ doro anya, mgbe e nwere mmụọ nke esemokwu, e wee nyekwa ekworo na ịma aka ohere ka ha gbanye mkpọrọgwụ n’ime ọgbakọ, a ghaghị inwe ụkọ ịhụnanya na mkpaghasị nke udo n’ime ezinụlọ nke okwukwe.—Gal. 5:15.
2 Ịlụ Ọgụ: Ụfọdụ adịghị ọbụna eche na ịlụ ọgụ, nke bụ ngosipụta nke ọnụma, bụ mmehie a pụrụ iji n’ihi ya chụpụ mmadụ n’ọgbakọ. N’ezinụlọ ụfọdụ nke ndị ụwa, ọ bụ ihe a na-ahụkarị na di na-eti nwunye ya ihe n’ihi ihe ndị dịịrị onwe onye ma ọ bụ mgbe a kpasuru ya iwe. Olee otú ọgbakọ ga-esi ele ihe dị otú ahụ anya ma ọ bụrụ na o metụtara ndị òtù nke ọgbakọ? N’ikwu okwu banyere mmetọ anụ ahụ dị otú ahụ nke gabigara ókè, Ụlọ Nche nke November 1, 1988, peji nke 22, paragraf nke 11 na-ekwu n’otu akụkụ, sị: “Ndị okenye ọgbakọ kwesịrị ileba anya ná mkpesa ndị e mere banyere iti ihe mgbe o metụtara ndị Kraịst abụọ n’ime alụmdi na nwunye nke nọ ná nsogbu, a pụkwara iji ya chụpụ mmadụ n’ọgbakọ.” Akwụkwọ Nsọ na-ekwu na “ọ dịghị onye ọ bụla kpọrọ ahụ onwe ya asị mgbe ọ bụla.” Ọgbakọ ndị Kraịst adịghị anakwere ndị na-eti nwunye ha ihe.—Efe. 5:29.
3 Ụzọ Isi Meghachi Omume Mgbe Nsogbu Bilitere: Na Jọn 13:34, 35 Onyenwe anyị Jisọs Kraịst sịrị na e kwesịrị iji ịhụnanya mata ezi ndị na-eso ụzọ ya. N’ikwu okwu gaa n’ihu na nke a Pọl onyeozi gụpụtara otú ezi ịhụnanya ndị Kraịst kwesịrị isi na-akpa àgwà. (Gụọ 1 Ndị Kọrint 13:4-7.) Ọzọ, na 1 Pita 4:8 ọ na-ekwu na “ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.” Ịhụnanya gị ò siruru ike nke ikpuchi mmejọ ma ọ bụ mmehie nke onye kwere ekwe ibe gị ma ọ bụ nke onye òtù ezinụlọ gị mere megide gị? Gbalịa ịzụlite àgwà ndị ga-enyere gị aka imeso ụmụnna na ndị òtù ezinụlọ gị ihe n’ụzọ ịhụnanya.
4 Usoro Ime Ihe Maka Idozi Esemokwu n’Ịhụnanya: Igosi mmetụta ibe na-akwalite ịdị n’otu n’etiti ndị na-ejere Jehova ozi. Otú ọ dị, n’oge a na-adịghị ahụkebe, esemokwu mmadụ na ibe ya pụrụ ibilite. Mgbe o metụtara okwu ndị dị oké mkpa, ndị Kraịst ga-agbaso ndụmọdụ Jisọs e dekọrọ na Matiu 18:15-17. Rịba nzọụkwụ mbụ ama. Ọ bụ isoro nanị nwanna gị kwurịta okwu. N’ebumnobi dị aṅaa? ‘Irite nwanna gị n’uru.’ Nzọụkwụ nke abụọ (ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa) bụ ịkpọrọ otu onye ma ọ bụ abụọ tinyere onwe gị wee gakwuru onye ahụ ‘ka e wee mee ka okwu ọ bụla e kwuru guzo n’ọnụ ndị àmà abụọ ma ọ bụ atọ.’ N’ọnọdụ ka ukwuu nzọụkwụ nke atọ nwere ike ghara ọbụna ịdị mkpa.
5 Ihe A Ga-atụle: Tupu e tinye Matiu 18:15-17 n’ọrụ, tụlee ịdị njọ nke mmehie e mere megide gị. Ụlọ Nche nke December 15, 1981, peji nke 17-20, na-ekwu na e nwere “mmehie ndi di njọ otú a na ha puru iduba n’ichupu mmadu n’ọgbakọ,” dị ka nkwutọ ma ọ bụ asịrị dị oké njọ. E kwesịghị inwe nnụrụ okwu ikpe nke okwu banyere nkwutọ ma ọ bụrụ na ndị o metụtara etinyebeghị Matiu 18:15-17 n’ọrụ. (Leekwa akwụkwọ Ozi Anyị, peji nke 142-145.) Onye ahụ e mejọrọ kwesịkwara ịjụ onwe ya, ‘M̀ pụrụ ịgbaghara ma chefuo?’—Kọl. 3:13.
6 A na-agba ndị Kraịst ume ịgbaso ihe nile dịịrị udo. (Rom 14:19; 1 Pita 3:10-12) Ọgbakọ ekwesịghị ịbụ ọgbọ agha maka ịlụso otu onye na ibe ya ọgụ, kama ebe udo maka ịnọ ná ntụkwasị obi ime mmụọ. Ya mere ọ bụrụ na esemokwu ebilite, ka anyị mụrụ anya idozi ha n’ịhụnanya ndị Kraịst.