Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ ndị a ga-enyefe na June: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi n’ụtụ ₦80. Ọ bụrụ na ọ dịghị, jiri Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ n’ụtụ ₦240, ma ọ bụ akwụkwọ ọ bụla dị 192 peji, mee ihe. July na August: A pụrụ iji nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị na-esonụ dị 32 peji mee ihe: Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ?—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, “Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie?, na Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs. RỊBA AMA: Ọgbakọ ndị ga-achọ ihe ndị a ga-akpọsa e depụtara n’elu kwesịrị itinye ọda ha na Literature Order Form (S-14) ha nke ọnwa ọzọ.
◼ Na-amalite n’izu nke September 9, 1996, a ga-amaliteghachi ịmụ akwụkwọ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ.
◼ Onye isi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ họpụtara kwesịrị ịgụzigharị akụkọ ndekọ ego ọgbakọ na June 1 ma ọ bụ ngwa ngwa o kwere omume mgbe nke ahụ gasịrị. Maara ọgbakọ ọkwa mgbe e meworo nke a.
◼ Iji mee ka ọ dịrị Society mfe karị ịhụ maka akwụkwọ ozi gị, i kwesịrị ime ihe ndị na-esonụ: (1) Depụta aha na adres gị nke ọma n’elu ebe akụkụ aka nri nke akwụkwọ ozi gị. (2) Bịanye aka gị ná ngwụsị akwụkwọ ozi gị, depụtakwa aha gị nke ọma n’okpuru mbịanye aka gị ebe ọ bụ na anyị agaghị enwe ike ịghọta ma ọ bụ ịgụ mbịanye aka gị. A dịghị ewere akwụkwọ ozi a na-abịanyeghị aka ma ọ bụ nke a na-amaghị onye dere ya dị ka ihe dị mkpa n’ihi ezighị ezi ha. Ọ bụrụ na i ji ígwè dee akwụkwọ ozi gị, i kwesịghị nanị idepụta aha gị n’ala ala ya, n’ihi na onye ọ bụla pụrụ iji ígwè dee akwụkwọ ozi ma denye aha gị ná ngwụsị. I kwesịrị ịbịanye aka gị n’elu aha i ji ígwè dee. Tupu i zipụrụ Society akwụkwọ ozi ọ bụla, biko nyochaa ya nke ọma iji jide n’aka na a gbasowo isi ihe abụọ e kwuru n’elu.