Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 8/96 p. 1
  • A Dịghị Ahapụ Izisa Ozi Ọma Ahapụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • A Dịghị Ahapụ Izisa Ozi Ọma Ahapụ
  • Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Otú Ha Ga-esi Anụ?
    Ozi Alaeze Anyi—2009
  • Na-ekwusa Ozi Ọma n’Akwụsịghị Akwụsị
    Ozi Alaeze Anyi—2008
  • Izi Ozi Ọma na Ịkụzi Ihe Dị Mkpa Maka Ime Ndị Na-eso Ụzọ
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2018
  • “Ndị Nwere Ezi Obi” Na-anabata Ozi Ọma Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1996
km 8/96 p. 1

A Dịghị Ahapụ Izisa Ozi Ọma Ahapụ

1 Ndị Kraịst oge mbụ ji ozi ha kpọrọ oké mkpa. Luk kọrọ, sị: “Kwa ụbọchị, n’ụlọ ukwu Chineke na n’ụlọ nke aka ha, ha adịghị ahapụ izi ihe na izisa ozi ọma Jisọs, na Ọ bụ Kraịst.” (Ọrụ 5:42) Ọ dịghị ihe pụrụ ijighachi ha azụ, ọbụnadị mkpagbu! (Ọrụ 8:4) Ha gwara ndị ọzọ banyere eziokwu ahụ kwa ụbọchị.

2 Gịnị banyere anyị? Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-aghọta ịdị ngwa nke oge ndị a? Uche m ọ̀ dị n’ịnọgide na-ezisa ozi ọma ahụ n’ahapụghị ya?’

3 Ihe Atụ Ndị nke Oge A nke Ime Nkwusa n’Ahapụghị Ahapụ: Otu nwanna nwanyị, onye na-arịa ọrịa polio, aghaghị ịnọ n’ime ígwè iku ume mgbe nile. O nweghị ike ịga Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ ịga mgbakọ. Ma o ji ọrụ n’aka nke ukwuu n’izisa ozi ọma. N’ime 37 afọ nke emegharịghị ahụ ya, o nwere ike inyere mmadụ 17 aka ịmụta eziokwu ahụ! Olee otú o si mee ya? Ọ bụ ezie na o nweghị ike ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ọ chọtara ụzọ isi gbaara ndị bịakwutere ya àmà mberede kwa ụbọchị.

4 Ọ dịwo mkpa na ụmụnna anyị na Bosnia nagidere agha na ụkọ. Ka o sina dị, ha nọgidere na-ekwusara ndị ọzọ mgbe nile. Na Sarajevo ndị nkwusa anọwo na-eru nkezi 20 hour kwa ọnwa n’ịgwa ndị ọzọ banyere ozi ọma ahụ, ha na-eduzikwa nkezi nke ọmụmụ Bible abụọ n’otu n’otu. N’agbanyeghị ọnọdụ ha siri ike, ha na-ekwusa, na-ezikwa ihe n’ahapụghị ahapụ.

5 Ndị na-eto eto na-egosipụtakwa ịnụ ọkụ n’obi maka ozi ahụ. A kpụbara otu ezinụlọ Ndịàmà na Rwanda n’ime otu ọnụ ụlọ ebe ndị soja jikeere igbu ha. Ezinụlọ ahụ rịọrọ maka ohere ibu ụzọ kpee ekpere. E kwenyere na nke a, nwatakịrị ha nwanyị, bụ́ Deborah, kpere ekpere n’olu dara ụda, sị: “Jehova, mụ na papa m tinyere magazin ise n’izu a. Olee otú anyị ga-esi jeghachi na nke ndị a iji zie ha eziokwu ahụ ma nyere ha aka inweta ndụ?” N’ihi okwukwe ya siri ike na ịhụnanya ya maka ozi ahụ, a hapụrụ ezinụlọ ahụ dum ndụ.

6 Taa, e nwere mkpa ịmụrụ anya maka ohere ịgbara ndị ọzọ àmà na ịchọta ndị “e doro ịnata ndụ ebighị ebi.” (Ọrụ 13:48) N’ikwekọ n’ọnọdụ ọgbakọ, ndị okenye ọgbakọ na-eme ndokwa maka ịgba àmà ìgwè n’oge ndị dị mma, ma ọ̀ bụ n’ụtụtụ, n’ehihie, ma ọ bụ n’uhuruchi. Isiokwu ndị dị n’Ozi Alaeze Anyị na ihe omume dị iche iche ná Nzukọ Ije Ozi, mgbakọ sekit, na mgbakọ distrikti na-atụ aro, na-enyekwa agbamume ndị kwesịrị oge ha maka ikere òkè n’ohere dị iche iche nke ịgba àmà Alaeze. Tinyere nke a, ndị nlekọta sekit na distrikti na-azụ ndị nkwusa n’ịgba àmà okporo ámá, na-egosi ụzọ isi rụọ ọrụ n’ókèala azụmahịa, ma na-egosipụta ụzọ ndị ọzọ a pụrụ isi gbaa àmà n’ebe ọ bụla a na-achọta ndị mmadụ. Ihe a dum na-emesi ike na a dịghị ahapụ izisa ozi ọma ahụ ahapụ!

7 Ndị ozi Jisọs ji nkwuwa okwu kwupụta, sị: “Anyị onwe anyị apụghị ịghara ikwu ihe nile anyị hụrụ nụkwa.” Olee otú ha si nọgidesie ike n’agbanyeghị ihe mgbochi nile? Ha rịọrọ Jehova ka o nyere ha aka, bụ́ nke o mere, “ha nile wee jupụta na Mmụọ Nsọ, wee were nkwuwa okwu na-ekwu okwu Chineke.” (Ọrụ 4:20, 29, 31) Ọ pụrụ ịbụ na a gaghị eji ahụmahụ ndị pụrụ iche n’ozi gọzie mmadụ nile, ma ọ bụrụ na anyị achọọ n’ezie izisa ozi ọma n’ahapụghị ahapụ, ọ bụrụkwa na anyị etinye mgbalị ime otú ahụ ọbụna kwa ụbọchị, Jehova ga-enyere anyị aka.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya