Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/96 p. 6-7
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—1996
Ozi Alaeze Anyi—1996
km 9/96 p. 6-7

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ ndị a ga-enyefe na September: Bekee—Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ, The Bible—God’s Word or Man’s? Efịk na Hausa—Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala, True Peace and Security—From What Source? Igbo—Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?, Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya, Irọrọ Uzọ Ndu nke Kachasi Nma, Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. Isoko—Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. Yoruba—Happiness—How to Find It, Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya, Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala, Ndu Nka Ọ̀ Bu Nani Ndu Dinu? (A ga-enyefe akwụkwọ ndị a nile na-aba n’akpa uwe e depụtara n’elu n’ụtụ dị ala bụ́ ₦50, ọnụ ego ndị ọsụ ụzọ, ₦40; akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’asụsụ Efịk, Hausa, Igbo, Isoko, na Yoruba bụ ₦80, ọnụ ego ndị ọsụ ụzọ, ₦50. E zigaworo òtù ndị okenye nile akwụkwọ ozi banyere nke a.) October: Ụtụ maka Teta! ma ọ bụ Ụlọ Nche ma ọ bụ maka magazin abụọ ahụ. November: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. A ga-eme mgbalị pụrụ iche iji sochie ntinye nile n’olileanya nke ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. December: Bekee—New World Translation ya na akwụkwọ ahụ bụ́ Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya? Yoruba—New World Translation of the Christian Greek Scriptures. Akwụkwọ ọzọ a pụrụ inyefe: Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ ma ọ bụ akwụkwọ ọ bụla nwere 192 peji. Asụsụ ndị ọzọ—Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ ma ọ bụ Akwukwọm nke Akukọ Bible. Akwụkwọ ọzọ a pụrụ inyefe: Akwụkwọ ọ bụla nwere 192 peji. RỊBA AMA: Ọgbakọ ndị ga-achọ ihe ndị a ga-akpọsa e depụtara n’elu kwesịrị itinye ọda ha na Literature Order Form (S-14) ha nke ọnwa ọzọ.

◼ Onye isi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ họpụtara kwesịrị ịgụzigharị akụkọ ndekọ ego ọgbakọ na September 1 ma ọ bụ ngwa ngwa o kwere omume mgbe nke ahụ gasịrị. Maara ọgbakọ ọkwa mgbe e meworo nke a.

◼ Ndị nkwusa na-eme atụmatụ ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka n’October kwesịrị itinye akwụkwọ n’oge. Nke a ga-enye ndị okenye ohere ime ndokwa ndị dị mkpa maka magazin, akwụkwọ, na ókèala.

◼ A na-echetara ndị okenye ịgbaso ntụziaka ndị e nyere na peji nke 21-23 nke Ụlọ Nche, April 15, 1991, banyere ndị ọ bụla a chụpụrụ n’ọgbakọ ma ọ bụ kewapụrụ onwe ha bụ́ ndị pụrụ ịchọ ka a nabataghachi ha.

◼ Na Saturday, October 26, 1996, a ga-emechi ogige Betel n’Igieduma. Ndị ọbịa ịbịa nleta ma ọ bụ iwere na ikesa akwụkwọ adịghị nke ga-ekwe omume n’ụbọchị ahụ.

◼ Ị̀ na-aghọta asụsụ maka ndị ogbi na ndị ntị chiri? Ị̀ pụrụ ije ozi ná nzukọ ndị Kraịst dị ka onye nsụgharị (onye na-asụ asụsụ ndị ogbi na ndị ntị chiri) maka ndị ntị chiri? Society na-edekọ aha ndị na-eji mmegharị ahụ ekwu okwu ná mba a. Ọ bụrụ na e mewo gị baptism, ọ bụrụkwa na i nwere nguzo dị mma n’ọgbakọ, ọ bụrụkwa na ị ga-enwe mmasị inye aka n’ụzọ nke a, biko nye odeakwụkwọ ọgbakọ aha gị ozugbo. Ma ụmụnna nwoke ma ụmụnna nwanyị pụrụ inye onwe ha n’afọ ofufo. Ndị okenye kwesịrị izitere anyị aha ndị nkwusa e mere baptism bụ́ ndị nwere nguzo dị mma n’ọgbakọ, nweekwa ike ịrụ ọrụ nke ọma n’okpuru nduzi. Anyị ga-enwe mmasị inweta ihe ọmụma a ozugbo.

◼ Biko lee n’okpuru maka nhazigharị ndị e meworo ‘n’Ebe Ndị A Ga-enwe Mgbakọ Distrikti na 1996,’ bụ́ nke pụtara n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke May 1996. Nye ọgbakọ ndị a gbanweworo ụbọchị ma ọ bụ ebe ha ga-enwe mgbakọ ha, onye isi oche ndị nlekọta kwesịrị ime ndokwa ka a maa ọkwa ná Nzukọ Ije Ozi na-eso nnata nke mbipụta nke a nke Ozi Alaeze Anyị.

November 15-17, 1996

AGBOR 1 (Bekee) Ọgbakọ nile dị na ME-13 dị ka aha ha si dị malite na A ruo I; ọgbakọ nile dị na ME-15 dị ka aha ha si dị malite na J ruo Z

November 22-24, 1996

AGBOR 2 (Bekee) ME-14: Bank Avenue (Agbor), Efezomor (Agbor), Elu Oke (Agbor), Morka (Agbor), Oriekaose (Agbor), Akumazi Umuocha, Umuokum (Akwukwu Town), Aliagwa, Alifekede, Alisimie, na Ekpon; ọgbakọ nile dị na ME-15 dị ka aha ha si dị malite na A ruo I

OYEDE 4 (Bekee) ME-10, 18

November 29–December 1, 1996

AGBOR 3 (Bekee) Ọgbakọ nile dị na ME-12 dị ka aha ha si dị malite na A ruo M; ọgbakọ nile dị na ME-14 E WEZỤGA Bank Avenue (Agbor), Efezomor (Agbor), Elu Oke (Agbor), Morka (Agbor), Oriekaose (Agbor), Akumazi Umuocha, Umuokum (Akwukwu Town), Aliagwa, Alifekede, Alisimie, na Ekpon

December 6-8, 1996

AGBOR 4 (Bekee) Ọgbakọ nile dị na ME-13 dị ka aha ha si dị malite na J ruo Z; ọgbakọ nile dị na ME-12 dị ka aha ha si dị malite na N ruo Z

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya