Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ ndị a ga-enyefe na February: Bekee—Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ ma ọ bụ The Bible—God’s Word or Man’s? Efịk na Hausa—Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala ma ọ bụ True Peace and Security—From What Source? Igbo—Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?, Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya, Irọrọ Uzọ Ndu nke Kachasi Nma, ma ọ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. Isoko—Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. Yoruba—Happiness—How to Find It, Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya, Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala, ma ọ bụ Ndu Nka Ọ̀ Bu Nani Ndu Dinu? (A ga-enyefe akwụkwọ nile dị 192 peji e depụtara n’elu n’ụtụ dị ala bụ́ ₦50 [ọnụ ego ndị ọsụ ụzọ, ₦40]; akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’asụsụ Efịk, Hausa, Igbo, Isoko, na Yoruba bụ ₦80 [ọnụ ego ndị ọsụ ụzọ, ₦50]. E zigaara òtù ndị okenye nile akwụkwọ ozi banyere nke a na May.) March: Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. April na May: Ụtụ Ụlọ Nche. Maka ozi etiti izu nakwa n’ókèala a na-arụzu mgbe mgbe, a pụrụ iji broshuọ ọhụrụ ahụ, bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?, mee ihe. RỊBA AMA: Ọgbakọ ndị ga-achọ ihe ndị a ga-akpọsa e depụtara n’elu kwesịrị itinye ọda ha na Literature Order Form (S-14) ha nke ọnwa ọzọ.
◼ Odeakwụkwọ na onye nlekọta ije ozi kwesịrị ịtụleghachi ọrụ nke ndị ọsụ ụzọ oge nile. Ọ bụrụ na nke ọ bụla na-enwe ihe isi ike n’iru ọnụ ọgụgụ hour a chọrọ, ndị okenye kwesịrị ime ndokwa maka inye aka. Maka aro ụfọdụ, tụleghachi akwụkwọ ozi Society (S-201) nke October 1, 1993, na October 1, 1992. Leekwa paragraf nke 12-20 nke ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke September 1986.
◼ Ndị nkwusa chọrọ ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa March, April, na May kwesịrị ime ndokwa ha ugbu a ma tinye akwụkwọ ha n’oge. Nke a ga-enyere ndị okenye aka ime ndokwa ozi ubi ndị dị mkpa, nweekwa magazin na akwụkwọ ndị ọzọ zuru ezu. E kwesịrị ịmara ọgbakọ ọkwa aha ndị nile a kwadoworo ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka.
◼ Malite ná mgbakọ sekit na ụbọchị mgbakọ pụrụ iche ndị a ga-enwe na February 1997, a gaghị enwe nri e siri esi. Otú ọ dị, a ga-enwe mmanya ọtọ bịrịbịrị na ihe ole na ole ndị ọzọ. Ya mere, onye ọ bụla ga-eweta ihe oriri nke ya. A ga-enye ihe ọmụma zuru ezu ma e mesịa.