Mgbakọ Mba Nile na 1998
Òtù Na-achị Isi na-eme atụmatụ inwe mgbakọ mba nile na 1998. Tinyere mgbakọ distrikti ndị a na-enwekarị, a ga-enwe ọtụtụ mgbakọ mba nile n’Ebe Ugwu America nakwa n’Africa, Esia, Europe, Latin America, ógbè Caribbean, na Ndịda Pacific.
A ga-enwe ọtụtụ n’ime mgbakọ ndị a pụrụ iche n’Ebe Ugwu America, a ga-akpọkwa ndị ọbịa site n’akụkụ nile nke ụwa. Ọzọ, anyị pụrụ ịtụ anya inwe ndị ozi ala ọzọ ná mgbakọ mba nile ndị a. A ga-akpọ ndị ozi ala ọzọ na ndị ọzọ ruru eru na-eje ozi pụrụ iche ná mba ọzọ òkù ịbịa otu n’ime mgbakọ ndị a ná mba ha ma ọ bụ nke dịdewere ya.
Ihe ọmụma ndị ọzọ banyere ụbọchị, ebe, iru eru nke ndị ga-abịa, ndokwa maka ndị ga-esi mba ọzọ bịa, na nkọwa ndị ọzọ ka ga-abịa. Alaka ga-agwa ọgbakọ banyere obodo mgbakọ mba nile ebe a ga-akpọ ndị nkwusa òkù ịga. A ga-enye ihe ọmụma banyere ụbọchị na ndokwa ndị a na-eme maka ndị ọbịa a họtara.