Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na September: Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ n’ụtụ ₦55. Akwụkwọ ọzọ a pụrụ inyefe: Life—How Did It Get Here? By Evolution or by Creation? (nke nnukwu, ₦170; nke obere, ₦85) ma ọ bụ Mankind’s Search for God n’ụtụ ₦85. October: Ụtụ maka Teta! ma ọ bụ Ụlọ Nche ma ọ bụ maka magazin abụọ ahụ. Na-amalite n’akụkụ ikpeazụ nke ọnwa ahụ, a ga-ekesa Akụkọ Alaeze nke 35. November: Nkesa nke Akụkọ Alaeze nke 35 ga-aga n’ihu. Ọgbakọ ndị jezuru ókèala ha site n’iji otu mkpụrụ Akụkọ Alaeze nke 35 jekwuru ndị nwe ụlọ n’ebe obibi ọ bụla pụrụ inyefe akwụkwọ Ihe Ọmụma. December: Bekee—New World Translation ya na akwụkwọ bụ́ The Bible—God’s Word or Man’s? Akwụkwọ ọzọ a pụrụ inyefe: Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ ma ọ bụ Akwukwọm nke Akukọ Bible. Yoruba—New World Translation of the Christian Greek Scriptures. Akwụkwọ ọzọ a pụrụ inyefe: Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ ma ọ bụ akwụkwọ ọ bụla nwere 192 peji. Asụsụ ndị ọzọ—Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ ma ọ bụ Akwukwọm nke Akukọ Bible. Akwụkwọ ọzọ a pụrụ inyefe: Akwụkwọ ọ bụla nwere 192 peji. RỊBA AMA: Ọgbakọ ndị ga-achọ ihe ndị a ga-akpọsa e depụtara n’elu, e wezụga Akụkọ Alaeze nke 35 nke a ga-ezigara ọgbakọ nile, kwesịrị itinye ọda ha na Literature Order Form (S-14) ha nke ọnwa ọzọ.
◼ Onye isi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ họpụtara kwesịrị ịgụzigharị akụkọ ndekọ ego ọgbakọ na September 1 ma ọ bụ ngwa ngwa o kwere omume mgbe nke ahụ gasịrị. Maara ọgbakọ ọkwa mgbe e meworo nke a.
◼ A na-echetara ndị okenye ịgbaso ntụziaka ndị e nyere na peji nke 21-23 nke Ụlọ Nche, April 15, 1991, banyere ndị ọ bụla a chụpụrụ n’ọgbakọ ma ọ bụ kewapụrụ onwe ha bụ́ ndị pụrụ ịchọ ka a nabataghachi ha.
◼ Ndị so ọgbakọ na-emekọ ihe kwesịrị izite ụtụ ọhụrụ na ndejupụtaghachi nile maka Ụlọ Nche na Teta!, tinyere ụtụ onwe onye ha, site n’ọgbakọ.
◼ Society adịghị ahụ maka ọda ndị nkwusa n’otu n’otu maka akwụkwọ. Onye isi oche ndị nlekọta kwesịrị ime ndokwa maka ịma ọkwa kwa ọnwa tupu e zigara Society ọda akwụkwọ nke ọgbakọ kwa ọnwa ka ndị nile nwere mmasị n’inweta akwụkwọ nke onwe ha nwee ike ịgwa nwanna na-elekọta akwụkwọ. Biko buru n’uche akwụkwọ ndị bụ nke a na-emere ọda pụrụ iche.
◼ Mgbe a na-eme ọda akwụkwọ, ọgbakọ kwesịrị iburu n’uche na a gaghị ekesa CD-ROM nke Society aghara aghara. Ọ bụ n’ụzọ bụ isi maka ndị nkwusa iji ya eme ihe.
◼ “Igbe Ajụjụ” nke Ozi Alaeze Anyị nke May 1997 tụrụ aro ka anyị kpachara anya banyere isoro ndị nkwusa na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe anyị rụọ ọrụ n’ozi. E nwere ezi ihe mere mmadụ nile ga-eji jiri ezi echiche mee ihe n’okwu a. Nke a apụtaghị na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị ma ọ bụ ọbụna ụmụnna nwoke ndị ọzọ apụghị isoro ụmụnna nwanyị rụọ ọrụ n’ozi ubi. Kama nke ahụ, a kọwara echiche ahụ bụ na ọ bụghị ihe amamihe dị na ya nwanna nwoke ịdị na-anọ mgbe nile nanị ya na otu onye ahụ bụ́ nwanyị nke na-abụghị onye ikwu ya.
◼ N’ógbè ọ bụla n’oge dị iche iche n’afọ, e nwere ụbọchị ezumike ụwa ndị na-enye ụmụaka ohere ịhapụ ịga akwụkwọ ma na-enye oge ịhapụ ọrụ ego. Ndị a na-enye ohere ndị magburu onwe ha maka ọgbakọ ikere òkè ka ukwuu n’ozi ubi. Ndị okenye kwesịrị ịtụ anya mgbe ọnọdụ ndị a ga-ebilite ma buru ụzọ gwa ọgbakọ n’oge banyere ndokwa ndị a na-eme maka ozi ìgwè n’oge ezumike.
◼ Akwụkwọ Ọhụrụ Ndị E Nwere:
Mpịakọta Teta! nke 1996—Bekee
Mpịakọta Ụlọ Nche nke 1996—Bekee
Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya—Efịk
◼ Compact Disk Ndị Ọhụrụ E Nwere:
Kingdom Melodies, Mpịakọta nke 2 na 3 (cdm-2; cdm-3)
Singing Kingdom Songs—Bekee