Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ ndị a ga-enyefe na November: Nkesa Akụkọ Alaeze nke 35 ga-aga n’ihu. Ọgbakọ ndị rụzuru ókèala ha site n’iji Akụkọ Alaeze nke 35 jekwuru ndị nwe ụlọ n’ụlọ ma ọ bụ n’ebe obibi nke ọ bụla nwere ike nyefee akwụkwọ Ihe Ọmụma n’ụtụ ₦55. December: Bekee—New World Translation ya na akwụkwọ bụ́ The Bible—God’s Word or Man’s? Akwụkwọ ọzọ a pụrụ inyefe: Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ ma ọ bụ Akwukwọm nke Akukọ Bible. Yoruba—New World Translation of the Christian Greek Scriptures. Akwụkwọ ọzọ a pụrụ inyefe: Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ ma ọ bụ akwụkwọ ọ bụla dị peji 192. Asụsụ ndị ọzọ—Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ ma ọ bụ Akwukwọm nke Akukọ Bible. Akwụkwọ ọzọ a pụrụ inyefe: Akwụkwọ ọ bụla dị peji 192. January: A pụrụ inyefe akwụkwọ ọ bụla dị peji 192 e biri n’akwụkwọ na-achanwụ achanwụ ma ọ bụ na-agbanwe ụcha ha ma ọ bụ nke ọ bụla e bipụtara tupu 1985 n’ọnụ ego dị ala. Ọ bụrụ na ọgbakọ ọ bụla nwere akwụkwọ Ime Ka Ndu Ezi-na-ulo Gi Nwe Obi-utọ, ha nwekwara ike inyefe mbipụta a n’ọnụ ego dị ala. A gaghị agụnye akwụkwọ ndị ọzọ dị peji 192 e bipụtara tupu 1985 bụ́ ndị e biri n’akwụkwọ na-adịghị achanwụ achanwụ ma ọ bụ na-adịghị agbanwe ụcha ha ná ndị a ga-enyefe n’ọnụ ego a e mere ka ọ dị ala. Akwụkwọ ọzọ a pụrụ inyefe: Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?, Ịdị n’Otu n’Ofufe nke Nanị Ezi Chineke Ahụ, Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ, ma ọ bụ Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ. February: Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! Akwụkwọ ọzọ a pụrụ inyefe: Akwụkwọ ọ bụla dị peji 192 ka mee ochie e nwere. RỊBA AMA: Ọgbakọ ndị ga-achọ ihe ndị a ga-akpọsa e depụtara n’elu kwesịrị itinye ọda ha na Literature Order Form (S-14) ha nke ọnwa ọzọ.