Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na February: Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. March: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Tinye uche n’ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. April na May: Asụsụ nile—ụtụ Ụlọ Nche na Teta! RỊBA AMA: Ọgbakọ ndị ga-achọ ihe ndị a ga-akpọsa e depụtara n’elu kwesịrị itinye ọda ha na Literature Order Form (S-14) ha nke ọnwa ọzọ.
◼ Odeakwụkwọ na onye nlekọta ije ozi kwesịrị ịtụleghachi ọrụ ndị ọsụ ụzọ oge nile. Ọ bụrụ na nke ọ bụla na-enwe ihe isi ike n’iru ọnụ ọgụgụ hour a chọrọ, ndị okenye kwesịrị ime ndokwa maka inye aka. Maka aro ụfọdụ, tụleghachi akwụkwọ ozi Society (S-201) nke October 1, 1993, na nke October 1, 1992. Leekwa paragraf nke 12-20 nke ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke September 1986.
◼ Na-amalite n’izu nke May 4, 1998, dịgide ruo nke February 15, 1999, a ga-amụ akwụkwọ ahụ bụ́ Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ. Anyị na-agba unu ume ịtụ ọda unu ugbu a maka akwụkwọ a a ga-amụ n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ.
◼ Ìgwè ndị nkwusa meworo nhazi ikere òkè n’ịrụ ókèala a na-eketaghị ọrụ n’ọnwa ndị na-abịanụ kwesịrị ime atụmatụ inyefe broshuọ Na-achọ ma ọ bụ akwụkwọ Ihe Ọmụma n’ozi ubi.