Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 5/98 p. 1
  • Mmụọ Jehova Nọnyeere Anyị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mmụọ Jehova Nọnyeere Anyị
  • Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ‘N’aha nke Mmụọ Nsọ’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Otú Mmụọ Chineke Si Duo Ndị Kraịst Na Narị Afọ Mbụ Na Otú O si Edu Ndị Kraịst Taa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ije Ije Site na Mmụọ Nsọ Na-eme Ka Anyị Na-ebi Ndụ Kwekọrọ ná Nrara Anyị Raara Onwe Anyị Nye Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Ụzọ Mmụọ Chineke Pụrụ Isi Metụta Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1998
km 5/98 p. 1

Mmụọ Jehova Nọnyeere Anyị

1 Dị ka Ndịàmà Jehova, anyị nwere ọrụ dị ukwuu e kenyere anyị. Jisọs sịrị: “A ghaghịkwa ibu ụzọ kwusaa ozi ọma nke m n’ihu mba nile.” (Mak 13:10) A tụlee ya n’otú mmadụ si ele ihe anya, nke a ga-adị ka ọ gaghị ekwe omume, ma ọ dịghị otú ahụ. Anyị nwere ikike kasị ike n’eluigwe na ala nke na-akwado anyị—mmụọ Chineke.—Mat. 19:26.

2 Ihe Àmà nke Narị Afọ Mbụ: N’iji amụma Aịsaịa mee ihe banyere onwe ya, Jisọs sịrị: “Mmụọ nke Onyenwe anyị dị n’ahụ m . . . izi . . . ozi ọma.” (Luk 4:17, 18) Tupu ọ rịgoro n’eluigwe, ọ gwara ndị ozi ya na ha ga-enweta ike n’otu aka ahụ site na mmụọ nsọ iji gbaa àmà ‘ruo ebe ụwa sọtụrụ.’ Mgbe nke ahụ gasịrị, mmụọ nsọ duziri Filip izi otu ọnaozi Etiopia ozi ọma, mmụọ nsọ zigara Pita na nke otu ọchịagha onye Rom, o zipụkwara Pọl na Banabas izisara mba ndị Jentaịl ozi ọma. Olee onye gaara eche na ndị mmadụ sitere ná nzụlite dịgasị otu ahụ ga-anabata eziokwu ahụ? Ma ha nabatara ya.—Ọrụ 1:8; 8:29-38; 10:19, 20, 44-48; 13:2-4, 46-48.

3 Ihe Àmà nke Oge A: Akwụkwọ Mkpughe na-emesi aka mmụọ nsọ na-etinye n’ọrụ nkwusa nke taa ike site n’ikwu, sị: “Mmụọ Nsọ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-asịkwa, Bịa. . . . Onye na-achọ ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.” (Mkpu. 22:17) Mmụọ ahụ akwaliwo òtù nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ nke Kraịst na ndị enyi ha bụ́ ”atụrụ ọzọ” izisara mmadụ nile ozi ọma. (Jọn 10:16) Anyị kwesịrị inwe nkwuwa okwu ná nkwusa anyị, ghara ịla azụ mgbe ọ bụla n’ịgakwuru ụdị mmadụ nile, na-enwe obi ike mgbe nile na mmụọ Chineke ga-enyere anyị aka. 1998 Yearbook na-enye ihe àmà doro anya na mmụọ Chineke nọgidere na-anọnyere ndị ohu ya. Leedị ihe ọ rụpụtara! N’afọ ije ozi abụọ gara aga, e mere nkezi nke ihe karịrị mmadụ 1,000 baptism kwa ụbọchị.

4 Nwee obi ike na mmụọ Chineke ga na-anọnyere anyị ka anyị na-ezisa ozi Alaeze ruo n’ókè ọ bụ uche Jehova. Ihe ọmụma a kwesịrị ịgba anyị ume, kwaliekwa anyị ịnọgide na-adọgbu onwe anyị n’ọrụ Alaeze ahụ kachasị mkpa.—1 Tim. 4:10.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya