Lee Ka O Si Dị Mma Ịga Mgbe Nile!
1 Ruo ọtụtụ iri afọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe, a machibidoro ọtụtụ n’ime ụmụnna anyị anyị hụrụ n’anya iwu izukọ n’ihu ọha. Cheedị echiche banyere ọṅụ ha nwere mgbe e wepụrụ mmachibido iwu ahụ, ha nweekwa ike inwere onwe ha izukọta ọnụ!
2 Banyere nleta o letara otu ọgbakọ dị otú ahụ, otu onye nlekọta sekit dere, sị: “N’uhuruchi Tuesday, kpọmkwem ná mmalite nleta m, ihe ndị na-ekpo ụlọ ọkụ kwụsịrị ịrụ ọrụ. N’èzí, ọ̀tụ̀tụ̀ ịjụ oyi dịgidere n’ọ̀tụ̀tụ̀ mmiri ji akpụkọ, n’ime ụlọ kwa, ọ bụ nanị ihe dị ka 5 degrees Celsius. Ụmụnna ahụ yi kootu, ibe ákwà ndị a na-atụhị n’olu, ihe e ji ekpuchi aka, okpu na boot. Ọ dịghị onye pụrụ ịsapeta Bible, ebe ọ bụ na ịsape akwụkwọ apụghị ikwe omume. Oyi ji m aka ọjọọ ka m yi suit m guzoro n’elu ikpo okwu, mgbe ọ bụla m kwukwara okwu, a pụrụ m ịhụ ka uzu oyi si m n’ọnụ pụta. Ma ihe masịrị m bụ na ọ dịghị otu okwu mkpesa m nụrụ. Ụmụnna nile kwuru otú o si tọọ ha ụtọ ịnọ n’ebe ahụ!” Ụmụnna ahụ echetụdịghị echiche ịhapụ nzukọ ahụ!
3 Ọ̀ Bụ Otú Ọ́ Dị Anyị? Ànyị na-eji ohere nke inwere onwe anyị ịgbakọta ọnụ ná nzukọ anyị kwa izu akpọrọ ihe? Ka ànyị na-ewere nzukọ dị iche iche n’ihe na-abụghị ihe mgbe ọnọdụ dị mma? Ịgachi nzukọ anya pụrụ ịbụ ihe na-adịghị mfe, a pụkwara inwe mgbe anyị nwere ezi ihe mere anyị na-ejighị gaa. Otú ọ dị, echezọla mgbe ọ bụla, na e nwere ndị nọ n’etiti anyị bụ́ ndị na-ahụ ịdị mkpa nke nzukọ, na-agakwa n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mgbe nile n’agbanyeghị ime agadi, nsogbu ahụ ike siri ike, nkwarụ, usoro ọrụ siri ike, na ibu ọrụ ndị ọzọ siri ike. Lee ezi ihe nleranya ọ bụ nye anyị iṅomi!—Tụlee Luk 2:37.
4 Ka anyị mee ya omenala anyị ịkwado ezi ofufe site n’ịgazu nzukọ anyị nile nke ndị Kraịst, malite n’ìgwè ọmụmụ akwụkwọ dị nta ruo ná mgbakọ ukwu. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji were ịga mgbakọ ndị a dị ka oké ihe? N’ihi na ọ bụ iwu Chineke ka anyị na-agbakọta ọnụ. Ma e nwere ihe ndị ọzọ dị mkpa kpatara ya. Abamuru nke ntụziaka Chineke na enyemaka nke mmụọ nsọ, bụ́ ndị a na-enweta ná nzukọ, dị anyị nile mkpa. (Mt. 18:20) A na-ewuli anyị elu site ná mgbarịta ume mgbe anyị so ụmụnna anyị na-akpakọrịta.—Hib. 10:24, 25.
5 Ná nnwogha ahụ, Pita kwuru, sị: “Nna anyị, ọ dị mma ka anyị nọ n’ebe a.” (Luk 9:33) Anyị kwesịrị inwe otu mmetụta ahụ banyere nzukọ anyị nile nke ndị Kraịst. N’ezie, lee ka o si dị mma ịga mgbe nile!