Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 12/98 p. 1
  • Ha Pụrụ Ịhụ na Anyị Dị Iche

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ha Pụrụ Ịhụ na Anyị Dị Iche
  • Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ozi Anyị Na-aghaghị Ịkpọsa
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Jehova Na-eduzi Ọgbakọ Ya
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • Ndị Kraịst Na-efe Ofufe n’Ime Mmụọ na n’Eziokwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Bụrụ Ezigbo Onye Na-eso Ụzọ Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1998
km 12/98 p. 1

Ha Pụrụ Ịhụ na Anyị Dị Iche

1 N’afọ gara aga, ihe karịrị ndị ọhụrụ 300,000 sonyeere anyị site n’ịbụ ndị e mere baptism. Gịnị ka ndị a hụworo n’ebe Ndịàmà Jehova nọ mere ha ji chọọ ịbụ akụkụ nke nzukọ Chineke? N’ihi gịnị ka anyị ji dị iche n’ebe okpukpe nile ọzọ dị? Lee azịza ụfọdụ ndị doro anya:

—Anyị na-arapagidesi ike na Bible kama ịbụ n’echiche onwe onye: Anyị na-efe Jehova Chineke ofufe “n’ime mmụọ na eziokwu,” dị nnọọ ka Jisọs Kraịst kwuru ka a na-eme. Nke a apụtawo ịjụ ụgha nile nke okpukpe na ime ihe kwekọrọ n’Okwu Chineke e dere ede.—Jọn 4:23, 24; 2 Tim. 3:15-17.

—Anyị na-agakwuru ndị mmadụ kama ichere ka ha bịakwute anyị: Anyị anarawo ọrụ Kraịst nyere bụ́ ime nkwusa na ịkụzi ihe, anyị na-eṅomikwa ihe nlereanya ya nke ịchọpụta ndị nwere obi eziokwu. Anyị na-achọ ha n’ụlọ ha, n’okporo ámá, ma ọ bụ n’ebe ọ bụla a pụrụ ịchọta ha.—Mat. 9:35; 10:11; 28:19, 20; Ọrụ 10:42.

—Anyị na-akụziri mmadụ nile ihe site na Bible n’efu: Anyị na-eji ihe onwunwe na ume ọrụ anyị eme ihe n’efu, na-etinye ihe karịrị otu ijeri awa n’ozi Chineke kwa afọ. N’eleghị mmadụ anya n’ihu, anyị na-eso ụdị mmadụ nile amụ Bible.—Mat. 10:8; Ọrụ 10:34, 35; Mkpu. 22:17.

—A zụrụ anyị nke ọma inyere ndị mmadụ aka n’ụzọ ime mmụọ: Site n’ọmụmụ Bible onwe onye na ntụziaka a na-enye anyị ná nzukọ ọgbakọ, na ná mgbakọ dị iche iche, anyị na-anata mmụta ọchịchị Chineke dị oké ọnụ ahịa nke na-aga n’ihu bụ́ nke na-eme ka anyị nwee ike inye ndị ọzọ ihe ọmụma ime mmụọ.—Aịsa. 54:13; 2 Tim. 2:15; 1 Pita 3:15.

—Anyị na-eji eziokwu ahụ akpọrọ ihe, na-etinye ya n’ọrụ ná ndụ anyị kwa ụbọchị: N’ihi ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ, anyị na-eme mgbanwe, na-eme ka ndụ anyị kwekọọ n’uche ya. Ụdị mmadụ ọhụrụ anyị nke yiri nke Kraịst na-adọta ndị ọzọ n’ebe eziokwu ahụ dị.—Kọl. 3:9, 10; Jes. 1:22, 25; 1 Jọn 5:3.

—Anyị na-agbalịsi ike isoro ndị ọzọ biri ma na-arụ ọrụ n’udo: Ịzụlite àgwà nsọpụrụ Chineke na-enyere anyị aka ịchịkwa omume na okwu ọnụ anyị. Anyị ‘na-achọ udo na-agbasokwa ya,’ n’ebe mmadụ nile nọ.—1 Pita 3:10, 11; Efe. 4:1-3.

2 Ihe nlereanya nke ibi ndụ ndị Kraịst nke ndị mmadụ na-ahụ ná nzukọ Jehova na-akwali ọtụtụ mmadụ ịnata eziokwu ahụ. Ka ihe nlereanya anyị nwee otu mmetụta ahụ n’ahụ ndị maara ma na-ahụ anyị.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya