Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 2/99 p. 3
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—1999
Ozi Alaeze Anyi—1999
km 2/99 p. 3

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na February: Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ n’ụtụ ₦55; (nke azụ ya na-esighị ike, ₦50). Akwụkwọ ọzọ a pụrụ inyefe: Akwụkwọ ọ bụla meworo ochie karị e nwere nke nwere peji dị 192 n’ụtụ a na-enyefe ya. March: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Akwụkwọ ọzọ a pụrụ inyefe: Akwụkwọ ọ bụla ọzọ nwere peji dị 192 n’ụtụ a na-enyefe ya. A ga-eme mgbalị pụrụ iche ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. April na May: Asụsụ nile—ụtụ Ụlọ Nche na Teta! Mee ka e nwee broshuọ Na-achọ maka ndị nwere mmasị, gbalịakwa ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi.

◼ Na-amalite n’izu nke March 22, 1999, a ga-amụ akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ. Mbipụta Ozi Alaeze Anyị nke a bu usoro ọmụmụ ihe ahụ dum. Ị pụrụ ime ya photocopy ma tinye ya n’ime akwụkwọ gị maka izo aka na ya ngwa ngwa. A kọwara otú a ga-esi tụlee okwu mmalite nke akwụkwọ ahụ na paragraf nke 5 n’isiokwu bụ́ “Ịmụ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ” na peji 1 nke Ozi Alaeze Anyị nke December 1992.

◼ Odeakwụkwọ na onye nlekọta ije ozi kwesịrị ịtụleghachi ọrụ ndị ọsụ ụzọ oge nile. Ọ bụrụ na nke ọ bụla na-enwe ihe isi ike n’ịrụtazu ọnụ ọgụgụ awa a chọrọ, ndị okenye kwesịrị ime ndokwa maka inye aka. Maka aro, tụleghachi akwụkwọ ozi Society na-ede kwa afọ bụ́ S-201 nke bu akara ụbọchị bụ́ October 1. Ọzọkwa lee paragraf 12-20 nke ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke September 1986.

◼ Anyị nwere ugbu a mbipụta CD-ROM nke 1997, Watchtower Library, na Bekee. Ọnụ ego ya bụ ₦860. Ndị nwere mmasị inweta ya pụrụ izite ọda ha site n’ọgbakọ. Biko rịba ama na ọ bụ n’ụzọ bụ́ isi maka ndị nkwusa iji ya na-eme ihe, ọ bụghị maka ọha na eze.

◼ Ọgbakọ nile kwesịrị ime ndokwa maka ime Ememe Ncheta nke afọ a na Thursday, April 1, mgbe anyanwụ dasịrị. Ọ bụ ezie na okwu ahụ pụrụ ịmalite n’oge karị, mbugharị nke ihe nnọchianya Ememe Ncheta ekwesịghị ịmalite ruo mgbe anyanwụ dasịrị. Mee nchọpụta n’ógbè unu iji mara mgbe anyanwụ ji ada n’ógbè unu. Ọ bụ ezie na ọ ga-adị mma ka ọgbakọ ọ bụla mee Ememe Ncheta nke ya, ọ pụrụ ịbụ na nke a agaghị ekwe omume mgbe nile. N’ebe ọtụtụ ọgbakọ na-eji otu Ụlọ Nzukọ Alaeze eme ihe, ma eleghị anya otu ọgbakọ ma ọ bụ karị pụrụ inweta ihe owuwu ọzọ iji mee ihe n’uhuruchi ahụ. N’ebe o kwere omume, anyị ga-atụ aro ka e nwee minit 40 ma ọ dịkarịa ala tupu a malite ihe omume ọzọ iji nwee ohere maka ikele ndị ọbịa, ịgba ndị ọhụrụ nwere mmasị ume, na iji rite uru zuru ezu site n’ememe ahụ. E kwesịkwara ichebara nsogbu nke ngafe na ndọba ụgbọala echiche, gụnyere ibula na ibute ndị mmadụ. Òtù ndị okenye kwesịrị ikpebi ndokwa ndị ga-akasị mma maka ọgbakọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya