Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 3/99 p. 1
  • Ncheta Ọnwụ Kraịst n’Ụwa Nile

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ncheta Ọnwụ Kraịst n’Ụwa Nile
  • Ozi Alaeze Anyi—1999
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Ihe Jehova na Jizọs Meere Gị
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Gịnị Ka Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị A Na-ejighị Ọtụtụ Ihe Mee Na-akụziri Anyị Banyere Eze Eluigwe?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị Nwere Ihe Dị Ukwuu Ọ Pụtara Nye Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Ihe Mere Anyị Ji Eme Ncheta Ọnwụ Jizọs
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1999
km 3/99 p. 1

Ncheta Ọnwụ Kraịst n’Ụwa Nile

1 Jehova enyewo anyị ọtụtụ onyinye n’ụba. A kọwara ihe nile si n’ịdị mma na ebere ịhụnanya ya pụta nke ọma dị ka “onyinye Ya nke a na-apụghị ịkọ akụkọ ya.” Ee, “amara Chineke” magburu onwe ya nke na anyị apụghị ịkọwa ya.—2 Kọr. 9:14, 15.

2 Onyinye Ya Kasị Ukwuu: Jisọs Kraịst, dị ka Onye Mgbapụta nke ihe a kpọrọ mmadụ, bụ onyinye kasị ukwuu. N’igosipụta oké ịhụnanya o nwere maka ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ, Jehova nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, nke ọ hụkwara n’anya. (Jọn 3:16) Ngọzi dị otú ahụ na-erughịrị anyị nke sitere n’aka Chineke kwesịrị ka e cheta ya n’ụwa nile. Olee mgbe, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa? N’uhuruchi Thursday, April 1, 1999, ndị Kraịst n’ụwa nile ga-eme ememe ncheta Nri Anyasị nke Onyenwe anyị, na-eme Ememe Ncheta nke àjà kasị àjà nile.—1 Kọr. 11:20, 23-26.

3 Kraịst nwụrụ n’ihi anyị ọbụna “mgbe anyị nọ na-abụ ndị mmehie,” anyị pụkwara igosi ekele anyị site n’ime Ememe Ncheta nke ọnwụ ya nakwa site n’ịkpọ ndị ọzọ ka ha soro anyị nọrọ n’oge ahụ dị oké mkpa.—Rom 5:8.

4 Ihe Omume Kasị Mkpa: Ncheta nke ọnwụ Kraịst na-eme ka ọ pụta ìhè n’ụzọ bụ́ isi na ọ kwadoro ọbụbụeze Chineke n’ụzọ na-enweghị ntụpọ. Ọ na-echetakwara anyị na anyị pụrụ inwe nguzo dị ọcha n’ihu Jehova site n’inwe okwukwe n’àjà Jisọs, si otú a bụrụ ndị ji nzọpụta n’aka. (Ọrụ 4:12) N’eziokwu, nke a bụ ihe omume kasị mkpa n’afọ!

5 Anyị na-egosipụta ịhụnanya maka ndị agbata obi anyị site n’ịkpọ ha òkù iso anyị mee ememe ncheta Nri Anyasị nke Onyenwe anyị. Ọtụtụ nde ndị matara ọnụ ahịa ya kasị elu ka pụrụ inweta uru nke ihe mgbapụta ahụ. (Fil. 3:8) Ndị nwere okwukwe n’àjà Kraịst pụrụ inweta olileanya e ji n’aka nke ndụ ebighị ebi.—Jọn 17:3.

6 Oge Ememe Ncheta na-enye anyị ohere ndị pụrụ iche iji gosi ekele maka obiọma kasị elu na-erughịrị anyị nke Chineke. Nke a bụ oge magburu onwe ya iji jiri ịnụ ọkụ n’obi kere òkè n’ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Uru dị ukwuu na-echere ndị nile ji ekpere na-atụgharị uche n’onyinye Jehova nyere anyị n’efu nke karịrị nkọwa ma mee ndokwa ịnọ ya n’ememe Nri Anyasị nke Onyenwe anyị n’afọ a!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya