Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na March: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi n’ụtụ ₦55 (nke azụ ya na-esighị ike, ₦50). Akwụkwọ ọzọ a pụrụ inyefe: Akwụkwọ ọ bụla ọzọ nwere peji dị 192 n’ụtụ a na-enyefe ya. A ga-eme mgbalị pụrụ iche ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. April na May: Asụsụ nile—ụtụ Ụlọ Nche na Teta! Nwee broshuọ Na-achọ maka ndị nwere mmasị, gbalịakwa ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. June: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi.
◼ Ndị nkwusa chọrọ ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka n’April na May kwesịrị ime atụmatụ ha ugbu a ma tinye akwụkwọ ha n’oge. Nke a ga-enyere ndị okenye aka ime ndokwa ndị dị mkpa maka ozi ubi, nweekwa magazin na akwụkwọ ndị ọzọ n’ụzọ zuru ezu. E kwesịri ịmara ọgbakọ ọkwa aha ndị nile a kwadoro ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka.
◼ Onyeisi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ họpụtara kwesịrị ịgụzigharị ihe ndekọ ego ọgbakọ na March 1 ma ọ bụ ngwa ngwa o kwere omume mgbe nke ahụ gasịrị. Mgbe e meworo nke a, maara ọgbakọ ọkwa mgbe a gụsịrị akụkọ ndekọ ego ọzọ.
◼ A ga-eme Ememe Ncheta na Thursday, April 1, 1999. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu na-adị na-enwe nzukọ na Thursday, a ga-ebugharị ha gaa n’ụbọchị ọzọ nke izu ma ọ bụrụ na ohere ga-adị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ bụrụ na nke a agaghị ekwe omume, o metụtakwa Nzukọ Ije Ozi unu, a pụrụ ịgbakwụnye ihe omume ndị metụtara ọgbakọ unu karịsịa ná Nzukọ Ije Ozi ọzọ.
◼ Ndị nọ n’ọgbakọ kwesịrị izite ụtụ ọhụrụ na ndejupụtaghachi nile maka Ụlọ Nche na Teta!, gụnyere ụtụ ha site n’ọgbakọ.
◼ Society adịghị ahụ maka ọda ndị nkwusa n’otu n’otu maka akwụkwọ. Onyeisi oche ndị nlekọta kwesịrị ime ndokwa maka ịma ọkwa kwa ọnwa tupu e zigara Society ọda akwụkwọ nke ọgbakọ kwa ọnwa ka ndị nile nwere mmasị inweta akwụkwọ nke onwe ha nwee ike ịgwa nwanna na-elekọta akwụkwọ. Biko buru n’uche akwụkwọ ndị bụ nke a na-emere ọda pụrụ iche.
◼ Mgbakọ sekit na ụbọchị mgbakọ pụrụ iche ndị na-esonụ ga-enwe akụkụ e dowere oche a hapụụrụ ndị ntị chiri bụ́ ndị a ga-atụgharịrị ihe omume ahụ n’asụsụ ogbi: Akabo (EE-8): May 1, 2 na September 18; Badagry (WE-14): June 19, 20 na September 19; Daluwon (WE-3): February 6, 7 na June 19; Ilesa (WE-15): April 3, 4 na August 8; Kaduna (NE-1): April 3, 4 na August 8; Ota (WE-7): May 1, 2 na September 5; Igwuruta Ali (EE-22): February 28 na July 24, 25; Ubogo (ME-7): May 15, 16 na September 26.
◼ E nwere ndehie ihe n’Ụlọ Nche nke January 1, 1999, peji nke 20, paragraf nke 19, n’ahịrịokwu ikpeazụ. Biko gbanwee “Lee iwepụ aha Jehova bụ́ Onye Ukwu Na-emezu nkwa, n’ụta ọ bụ!” ka ọ bụrụ “Lee iwepụ Jehova bụ́ Onye Ukwu Na-emezu nkwa, n’ụta ọ bụ!”