Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/00 p. 3
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—2000
Ozi Alaeze Anyi—2000
km 1/00 p. 3

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na January: Akwụkwọ ọ bụla nwere peji dị 192 bụ́ nke e bipụtara tupu 1986 nke ọgbakọ pụrụ inwe n’ụtụ ₦40. Ọgbakọ ndị na-enweghị akwụkwọ ndị dị otú ahụ pụrụ inyefe Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala (nke nta, ₦100; nke ukwu, ₦195). February: Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. March: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. A ga-etinye mgbalị pụrụ iche ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. April: Ụlọ Nche na Teta! Meenụ ka e nwee broshuọ Na-achọ maka ndị nwere mmasị, gbalịakwa ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi.

◼ Ndị nkwusa nile e mere baptism nọ ná Nzukọ Ije Ozi n’izu January 10 pụrụ inweta kaadị Advance Medical Directive/Release na Identity Card maka ụmụ ha.

◼ Na-amalite na February, n’agafeghịkwa March 5, okwu ihu ọha ọhụrụ maka ndị nlekọta sekit ga-abụ “Ezigbo Amagedọn—N’ihi Gịnị? Ole Mgbe?”

◼ Ọgbakọ nile kwesịrị ime ndokwa ndị kwesịrị ekwesị maka ime Ememe Ncheta nke afọ a na Wednesday, April 19, mgbe anyanwụ dasịrị. Ọ bụ ezie na okwu pụru ịmalite n’oge karị, mbugharị nke ihe nnọchianya Ememe Ncheta ekwesịghị ịmalite ruo mgbe anyanwụ dasịrị. Mee nchọpụta n’ógbè unu iji mara mgbe anyanwụ ji ada n’ógbè unu. Ọ bụ ezie na ọ ga-adị mma ka ọgbakọ ọ bụla mee Ememe Ncheta nke ya, ọ pụrụ ịbụ na nke a agaghị ekwe omume mgbe nile. N’ebe ọtụtụ ọgbakọ na-eji otu Ụlọ Nzukọ Alaeze eme ihe, ma eleghị anya otu ọgbakọ ma ọ bụ karị pụrụ inweta ihe owuwu ọzọ ha ga-eji mee ihe n’uhuruchi ahụ. N’ebe o kwere omume, anyị ga-atụ aro ka e nwee minit 40 ma ọ dịkarịa ala mgbe e mesịrị ihe omume tupu a malite ihe omume ọzọ ka mmadụ nile wee rite uru zuru ezu n’ememe ahụ, na-enye ohere maka ikele ndị ọbịa na ịgba ndị ọhụrụ nwere mmasị ume. E kwesịkwara ichebara ọnọdụ ụgbọala na ebe ndọwa ha echiche, gụnyere ibusa na iburu ndị mmadụ. Òtù ndị okenye kwesịrị ikpebi ndokwa ndị ga-akasị mma n’ógbè ha.

◼ A ga-ekwu okwu ihu ọha pụrụ iche maka oge Ememe Ncheta 2000 na Sunday, April 16. Isiokwu ya ga-abụ “Ihe Mere Ihe Mgbapụta Ji Dị Ihe A Kpọrọ Mmadụ Mkpa.” A ga-enye ihe ndepụta okwu. Ọgbakọ ndị onye nlekọta sekit na-eleta, ndị nwere mgbakọ sekit, ma ọ bụ ụbọchị mgbakọ pụrụ iche ná ngwụsị izu ahụ, ga-ekwu okwu ihu ọha ahụ pụrụ iche n’izu na-eso ya. Ọ dịghị ọgbakọ kwesịrị ikwu okwu ihu ọha ahụ pụrụ iche tupu April 16, 2000.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya