Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na May: Magazin Ụlọ Nche na Teta! Nwee broshuọ Na-achọ maka ndị nwere mmasị, gbalịakwa ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. June: Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? Tinye uche n’ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. July na August: A pụrụ iji nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị na-esonụ nwere peji dị 32 mee ihe: Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ na Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs. A pụrụ inyefe broshuọ bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile na Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie? n’ebe o kwesịrị.
◼ N’Ozi Alaeze Anyị nke July 1994, e kwuru na a gaghị eduzi nleta ngagharị na Saturday ikpeazụ nke ọnwa ọ bụla. A na-eme mgbanwe ugbu a na nke a. A ga-emepere ọgbakọ ma ọ bụ ndị mmadụ n’otu n’otu ihe owuwu Betel dị n’Igieduma maka ime nleta ngagharị na Saturday nile dị n’ọnwa. A ga-eduzi nleta ngagharị n’agbata elekere 8:00 na nke 11:00 nke ụtụtụ na n’agbata elekere 1:00 na nke 4:00 nke uhuruchi, site na Monday ruo Saturday. Unu kwesịrị irute n’oge maka ime nleta ka unu wee nwee ike imecha n’oge ma laghachi n’ụbọchị ahụ. E nweghị ndokwa ọ bụla maka inye ìgwè ndị bịara ime nleta ngagharị ebe ha ga-arahụ na Betel. Biko rịbanụ ama na a gaghị enwe nleta ngagharị na Sunday.
◼ Onyeisi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ họpụtara kwesịrị ịgụzigharị ihe ndekọ ego ọgbakọ na June 1 ma ọ bụ ngwa ngwa o kwere omume mgbe nke ahụ gasịrị. Mgbe e meworo nke a, maara ọgbakọ ọkwa mgbe a gụsịrị akụkọ ndekọ ego ọzọ.