Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ ndị a ga-enyefe na November: Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? ma ọ bụ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Ọ bụrụ na ndị mmadụ enweelarị ha, a pụrụ inyefe akwụkwọ ọzọ mere ochie karị. December: Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. Ọ bụrụ na e nweghị ya, ị pụrụ inyefe Akwukwọm nke Akukọ Bible, ma ọ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. January: Akwụkwọ ọ bụla nke nwere peeji dị 192 bụ́ nke e bipụtara tupu 1987 nke ọgbakọ nwere. February: Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!, ma ọ bụ akwụkwọ ọ bụla mere ochie karị nke nwere peeji dị 192 bụ́ nke ọgbakọ nwere.
◼ Onyeisi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ họpụtara kwesịrị ịgụzigharị ihe ndekọ ego ọgbakọ na December 1 ma ọ bụ ngwa ngwa o kwere omume mgbe nke ahụ gasịrị. Mgbe e meworo nke a, maara ọgbakọ ọkwa mgbe a gụsịrị akụkọ ndekọ ego ọzọ.
◼ Alaka ụlọ ọrụ adịghị ahụ maka ọda akwụkwọ nke ndị nkwusa n’otu n’otu. Onyeisi oche ndị nlekọta kwesịrị ime ndokwa maka ịma ọkwa kwa ọnwa tupu e zigara alaka ụlọ ọrụ ọda akwụkwọ nke ọgbakọ kwa ọnwa ka ndị nile nwere mmasị inweta akwụkwọ nke onwe ha nwee ike ịgwa nwanna na-elekọta akwụkwọ. Biko buru n’uche akwụkwọ ndị bụ́ ndị a na-emere ọda pụrụ iche.