Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 2/02 p. 7
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—2002
Ozi Alaeze Anyi—2002
km 2/02 p. 7

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na February: Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!, ma ọ bụ akwụkwọ ọ bụla mere ochie karị nke nwere peeji dị 192 nke ọgbakọ nwere. March: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. A ga-eme mgbalị pụrụ iche ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. April na May: Magazin Ụlọ Nche na Teta! N’ebe e gosiri mmasị, nyefee broshuọ Na-achọ, n’ebumnobi nke ịmalite ọmụmụ Bible.

◼ Mgbe a na-arụ ókèala a na-eketaghị ọrụ, ndị nkwusa pụrụ inyefe broshuọ Na-achọ ma ọ bụ akwụkwọ Ihe Ọmụma. A pụrụ inyefe mbipụta ọzọ ma ọ bụrụ na onye nwe ụlọ enweworị mbipụta abụọ ndị a. Mmadụ nile kwesịrị ịchịrị traktị dị iche iche maka ndị na-anọghị n’ụlọ ma ọ bụ ndị na-anataghị akwụkwọ. E kwesịrị ime mgbalị isochi mmasị, karịsịa n’ókèala ndị a na-eketaghị ọrụ bụ́ ebe ọgbakọ ndị dị nso pụrụ ịgaru.

◼ Onyeisi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ họpụtara kwesịrị ịgụzigharị ihe ndekọ ego ọgbakọ na March 1 ma ọ bụ ngwa ngwa o kwere omume mgbe ọ gasịrị. Mgbe e meworo nke a, maara ọgbakọ ọkwa mgbe a gụsịrị akụkọ ndekọ ego ọzọ.

◼ Maka mgbakọ sekit na ụbọchị mgbakọ pụrụ iche ndị a ga-enwe na 2002, sekit ndị na-esonụ ga-enwe otu akụkụ ebe a na-anọdụ ala bụ́ nke a ga-ewepụta iche maka ndị ntị chiri bụ́ ndị a ga-asụgharịrị ihe omume ahụ gaa n’Ụdị Asụsụ Ogbi nke America (ASL):

Akabo (EE-08) July 6-7 na March 31

Akure (WE-12) May 11-12 na August 25

Badagry (WE-23) October 5-6 na May 19

Enugu (EE-17) August 31–September 1 na May 4

Igwuruta Ali (EE-22) February 9-10 na June 29

Ilesa (WE-15) March 23-24 na July 7

Kaduna (NE-01b) March 30-31 na July 27

Ota (WE-07) April 20-21 na August 17

Ubogo (ME-07) June 8-9 na September 8

◼ Odeakwụkwọ na onye nlekọta ije ozi kwesịrị ịtụleghachi ọrụ ndị ọsụ ụzọ oge nile dum. Ọ bụrụ na ọ dị onye nke na-enwe ihe isi ike ịrụzu ọnụ ọgụgụ awa a chọrọ, ndị okenye kwesịrị ime ndokwa ka e nyere ya aka. Maka aro ụfọdụ, tụleghachi akwụkwọ ozi bụ́ S-201 a na-ezite kwa afọ. Leekwa paragraf nke 12-20 n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke September 1986.

◼ Kpachara anya maka atụmatụ aghụghọ ndị a nọworo na-agbasa n’Internet nakwa na E-mail na-arịọ ụmụnna anyị maka ego ná nzọrọ nke inyere ndị ọdachi metụtara aka. Mgbe ọ bụla ọnọdụ chọrọ ka e guzobe kọmitii enyemaka iji nyere Ndịàmà Jehova aka n’ụzọ ihe onwunwe, a ga-agwa ụmụnna ndị na-ahụ maka ya. E kwesịrị izite onyinye maka mkpa ndị dị otú ahụ na Watch Tower, P.M.B. 1090, Benin City, Edo State.

◼ A ga-ekwu okwu ihu ọha pụrụ iche maka oge Ememe Ncheta 2002 na Sunday, April 14. Isiokwu ya ga-abụ “Buru ‘Ụbọchị ahụ Dị Egwu’ n’Uche!” A ga-enye ihe ndepụta okwu. Ọgbakọ ndị ga-enwe onye nlekọta sekit ma ọ bụ mgbakọ ná ngwụsị izu ahụ, ga-ekwu okwu ihu ọha ahụ pụrụ iche n’izu nke na-esonụ. Ọ dịghị ọgbakọ kwesịrị ikwu okwu ihu ọha ahụ pụrụ iche tupu April 14, 2002.

◼ Akwụkwọ Ọhụrụ Ndị E Nwere:

Ì Nwere Mmụọ Na-adịghị Anwụ Anwụ? (Traktị nke 25)—Abụa, Bekee, Edo, Efịk, French, Gun, Hausa, Igala, Igbo, Isoko, Khana, Tiv, Urhobo, na Yoruba

Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II—Bekee, Efịk, French, Gun, Igbo, na Yoruba

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya