Nwee Afọ Ojuju n’Ihe I Nwere
1 Akwụkwọ Nsọ na-adụ anyị ọdụ ka anyị na-enye ezinụlọ anyị ihe na-akpa ha n’ụzọ anụ ahụ́, ma nke a ekwesịghị ịbụ ebe anyị lekwasịrị anya ná ndụ. Ihe ime mmụọ aghaghị ibute ụzọ. (Mat. 6:33; 1 Tim. 5:8) Inwe echiche ziri ezi siri ike ‘n’oge a pụrụ iche nke siri ike obibi.’ (2 Tim. 3:1) Gịnị ga-enyere anyị aka inwe ya?
2 Inwe Echiche nke Bible: Okwu Chineke na-adọ anyị aka ná ntị na nchụso nke akụ̀ na ụba pụrụ ịkpata mbibi ime mmụọ. (Ekli. 5:10; Mat. 13:22; 1 Tim. 6:9, 10) N’oge a siri ike, ọ ga-abụ ihe ọdachi nye onye ọ bụla n’ime anyị imikpu onwe ya n’ọrụ ego ma ọ bụ n’ịchụso ego nke na anyị ga-edebe ihe ime mmụọ—nzukọ, ọmụmụ ihe, na ije ozi—n’ọnọdụ nke abụọ ná ndụ anyị. (Luk 21:34-36) N’ụzọ dị iche, Bible na-adụ ọdụ, sị: “Ebe anyị nwere ihe oriri na ihe mgbokwasị, anyị ga-enwe afọ ojuju n’ihe ndị a.”—1 Tim. 6:7, 8.
3 Nke a apụtaghị na a chọrọ ka Ndị Kraịst jiri aka ha mee onwe ha ogbenye. Kama, ọ na-enyere anyị aka ịmata ihe ndị dị anyị mkpa n’ezie n’ụzọ ihe onwunwe—ihe oriri, uwe, na ebe obibi nke kwesịrị ekwesị maka ógbè ebe anyị bi. Ọ bụrụ na anyị nwere ihe ndị dị mkpa ná ndụ, anyị ekwesịghị ịdị na-achụso ọnọdụ ibi ndụ dị elu karị n’akwụsịghị akwụsị. Mgbe anyị na-eche echiche ịzụ otu ihe ma ọ bụ iwere ọrụ ọzọ, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị sị, ‘Nke a ọ̀ dị mkpa n’ezie?’ Ime otú a ga-enyere anyị aka ịṅa ntị na ndụmọdụ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ, bụ́: “Ka ụzọ ndụ unu bụrụ nke ịhụnanya ego na-adịghị na ya, ka unu nọ na-enwe afọ ojuju n’ihe ndị dị ugbu a.”—Hib. 13:5.
4 Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi, ọ ga-agọzi anyị. (Ilu 3:5, 6) Ọ bụ ezie na anyị ga-arụsi ọrụ ike iji nweta ihe ndị dị anyị mkpa kwa ụbọchị, anyị adịghị eme ka ndụ anyị hiwe isi n’ihe ndị ahụ. Ma anyị dara ogbenye ma anyị bara ọgaranya, anyị na-adabere n’ebe Jehova nọ maka igbo mkpa anyị. (Fil. 4:11-13) N’ihi ya, anyị na-enweta afọ ojuju nke Chineke na-enye tinyere ọtụtụ ngọzi ndị ọzọ.
5 Ṅomie Okwukwe nke Ndị Ọzọ: Otu nne nanị ya na-azụ nwa nke zụlitere nwa ya nwanyị n’ụzọ nke eziokwu nọgidere na-eme ka ndụ ya dịwanye mfe. Ọ bụ ezie na ahụ́ ruru ya ala n’ebe obibi ya, ọ kwafere n’ụlọ dị nta karị ma mesịakwa kwafee n’ụlọ nwere otu ọnụ ụlọ otu ọnụ ụlọ. Nke a mere ka o nwee ike ibelata oge ọ na-eji arụ ọrụ nke mere ka o nwee ike itinyekwu oge n’ozi. Mgbe nwa ya nwanyị tolitere ma lụọ di, nne ahụ lara ezumike nká tupu oge ya eruo, ọ bụ ezie na nke a pụtara na ego ọ na-enweta belatakwuru. Nwanna anyị nwanyị nọ ugbu a n’ime afọ nke asaa ya nke ije ozi dị ka onye ọsụ ụzọ oge nile, ọ dịghịkwa akwa ụta ma ọlị n’ihi ihe onwunwe ndị ọ chụrụ n’àjà iji bute ihe ndị metụtara Alaeze ahụ ụzọ ná ndụ ya.
6 Otu onye okenye na nwunye ya sụrụ ụzọ ruo ọtụtụ afọ ka ha nọ na-azụlite ụmụaka atọ. Dị ka ezinụlọ, ha mụtara inwe afọ ojuju n’inweta ihe dị ha mkpa kama ịbụ ihe ndị ha chọrọ. Nwanna nwoke ahụ na-ekwu, si: “Anyị biri ndụ dị mfe karị. Ọ bụ ezie na anyị enwewo oge ihe isi ike ụfọdụ, Jehova anọgidewo na-enye anyị ihe ndị dị anyị mkpa. . . . Mgbe m na-ahụ ka ezinụlọ m na-ebute ihe ime mmụọ ụzọ otú a, ana m enwe mmetụta na ihe nile dị otú ha kwesịrị ịdị, ana m enwekwa afọ ojuju.” Nwunye ya gbakwụnyere, sị: “Mgbe m na-ahụ ka [di m] ji ọrụ n’aka n’ihe ime mmụọ, ana m enwe afọ ojuju buru ibu.” Ụmụ ha nwekwara obi ụtọ na ndị mụrụ ha kpebiri iji oge ha nile jeere Jehova ozi.
7 Bible na-ekwe ndị nile họọrọ ịgbaso ụdị ụzọ ahụ nke nsọpụrụ Chineke kama ịchụso ihe onwunwe nkwa ngọzi bara ụba ma ugbu a ma ná ndụ nke gaje ịbịa.—1 Tim. 4:8.