Ịkwaga ná Mba Ọzọ n’Ụzọ Iwu Na-akwadoghị—Kpachara Anya Maka Ihe Ize Ndụ Ndị Zoro Ezo Dị na Ya
1 Ka ọnọdụ akụ̀ na ụba ụwa na-adịwanye njọ kwa ụbọchị, ụfọdụ ndị akwagawo ná mba ndị bara ọgaranya karị n’ụzọ iwu na-akwadoghị iji nweta ọrụ ka mma. N’ọnọdụ ụfọdụ, ndị òtù ezinụlọ dum atụkọtawo ego ma ọ bụ gbaziri ego buru ibu iji kwado otu onye òtù ezinụlọ ịga ofesi. Olileanya ha bụ inwe ego site n’ego ọ ga na-arụta iji mee ka ezinụlọ ahụ baa ọgaranya. Olee ihe ndị onye bụ́ otu n’ime ndị ohu Jehova kwesịrị ịtụle tupu ya ekpebie ịkwaga ná mba ọzọ?
2 Ònye Bụ Onye Kwagara ná Mba Ọzọ n’Ụzọ Iwu Na-akwadoghị? Onye kwagara ná mba ọzọ n’uẓọ iwu na-akwadoghị bụ onye kwagara n’ebughị ụzọ nweta akwụkwọ ndị kwesịrị ekwesị ndị ga-enye ya ikike ibiri ebe ahụ n’ụzọ iwu kwadoro. Nke a bụ imebi iwu. Bible na-enye Ndị Kraịst iwu ka ha rube isi n’iwu Siza nile ndị na-emegideghị iwu Chineke. (Ọrụ 5:29; Rom 13:1) N’ụzọ dị otú a, ha pụrụ inwe akọ na uche dị ọcha ma zere ntaramahụhụ. Ọ bụrụ na Onye Kraịst emebie nke ọ bụla n’ime iwu Siza, ọ ghaghị iburu ihe ọ bụla si n’ihe o mere pụta.—Rom 13:3-5.
3 N’ụzọ dị mwute, ụfọdụ ndị nkwusa nke ozi ọma ahụ elegharawo ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ahụ e kwuru n’elu anya. Ha akwagawo ma malite ọrụ ná mba ọzọ n’ụzọ iwu na-akwadoghị. Ọtụtụ mgbe, ụdị nkwapụ ahụ na-agụnye ịghọ aghụghọ ndị ọzọ bụ́ mmehie, dị ka inye aka azụ na inweta akwụkwọ ime njem adịgboroja.—2 Kọr. 4:2.
4 Ihe Ize Ndụ Ndị Dị n’Ụzọ: N’ihi na ha nwere akwụkwọ iwu na-akwadoghị, ọtụtụ ndị na-esoro ụzọ ndị iwu na-akwadoghị aga bụ́ nke pụrụ ịkpata ihe ize ndụ dị oké njọ. Ụfọdụ anwụọla n’ihi ụgbọ mmiri ikpu ma ọ bụ bụrụ ndị agụiyi tagburu ka ha ji ụkwụ na-agafe mmiri ndị dị ize ndụ. Ndị ọzọ anwụọla n’ọzara n’ihi agụụ ma ọ bụ bụrụ ndị chọtara onwe ha n’ogige ọrụ mmanye ma ọ bụ dị ka ndị akwụna. Ọ bụghị ihe ọhụrụ ịnụ na onye òtù ezinụlọ nke gara ofesi na ndị ikwu ya adịkwaghị ezirịta ozi ma ọ bụ na ha adịghị anụkwa banyere ya ọzọ. Ọ̀ ga-abụ na ndị dị otú ahụ anwụọla mgbe ha na-aga ná mba ahụ ha chọrọ ịga ma ọ bụ na a tụwo ha mkpọrọ?
5 Ihe Ize Ndụ Ime Mmụọ: Ndị omekome ndị aka ha dị n’ịzụ ahịa ọgwụ ọjọọ na ịgba akwụna na-akwado ọtụtụ ndị na-akwaga mba ọzọ n’ụzọ iwu na-akwadoghị, bụ́ ndị a na-amanyekarị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mgbe nile ime ihe ndị kwadoro ha chọrọ ka ha mee. Otu Onyeàmà nke zutere ọtụtụ n’ime ndị dị otú ahụ na-aga ịghọ ndị kwagara mba ọzọ n’ụzọ iwu na-akwadoghị tupu ha agawa degaara otu n’ime alaka ụlọ ọrụ Society ihe na-esonụ:
6 “[N’oge na-adịghị anya], ha na-eche ihe bụ́ eziokwu ihu ma na-achọpụta ihe ga-abụ ‘ọrụ’ ha n’ezie. A na-anapụ ha akwụkwọ ha ma manye ha ‘ịrụ ọrụ’ [dị ka ndị akwụna] ma n’ehihie ma n’abalị iji kwụọ ‘ụgwọ’ ahụ. Ọ pụrụ iwe ọtụtụ afọ iji nweta ego dị otú ahụ.”
7 Hà pụrụ ijekwuru ndị ọchịchị maka nchebe? Akụkọ ahụ gara n’ihu ikwu, si: “Ọ bụrụ na ha ajụ [ime ihe ndị òtù ahụ kwuru,] a na-eti ha ihe ma na-edina ha n’ike ruo mgbe ike gwụrụ ha, ha ekwekọrịta ma mee ihe a gwara ha mee. E wezụga imeso ha mmeso ọjọọ ihu na ihu, ndị isi nke òtù ahụ na-eyi ha egwu na ọ bụrụ na ha akọọrọ ndị uwe ojii, chọọ enyemaka ma ọ bụ chọọ ịgba ọsọ na ha ga-egbu ma ọ bụ merụọ ndị mụrụ ha ma ọ bụ ndị ikwu ha nọ n’ụlọ ahụ́. Otu n’ime ‘ụkpụrụ’ òtù ahụ ji eme ihe bụkwa [ịhụ] na e mere ka ụmụ agbọghọ gbanwee [ebe obibi] ha tupu ha amata gburugburu ebe ha bi nke ọma, ka o wee bụrụ na ọ dịghị mgbe ụkwụ ga-esi ha ike n’ala, ha agaghịkwa enwe onye inye aka, n’ụzọ dị otú ahụ, ha ga-adị mfe ịchịkwa karị.”—Tụlee 1 Timoti 6:9, 10.
8 Ị̀ ga-ekwe ka e bibie ọnọdụ ime mmụọ nke nwa gị ma ọ bụ nke onye ikwu gị otú a n’ihi uru akụ̀ na ụba? N’ezie, ụfọdụ pụrụ iru ebe ha na-aga n’ezuteghị nke ọ bụla n’ime nsogbu ndị a a ka kwusịrị okwu ha. Ma, n’ihi ụjọ nke ịbụ ndị ndị ọchịchị nwụdere, ha na-ezogharị mgbe nile, si otú ahụ na-eme ka o siere ha ike ịgachi nzukọ ọgbakọ anya ma ọ bụ ikere òkè n’ozi ubi, n’ihi ya na-etinye ọnọdụ ime mmụọ ha n’ihe ize ndụ.—Mat. 24:14; 28:19; Hib. 10:23-25.
9 Ka anyị na-abamikwu n’ime ụbọchị ikpeazụ nke ajọ usoro ihe a, ọnọdụ ga-esiwanyerịrị ike. (2 Tim. 3:1-5) N’eziokwu, ndị mmadụ n’otu n’otu na ndị isi ezinụlọ nwere ibu ọrụ nke ịkpata ihe ha na ezinụlọ ha ga-eji na-ebi ndụ. (Efe. 4:28; 1 Tim. 5:8) Ma, ọ̀ bụ na anyị enweghị ibu ọrụ ka mkpa nke igbo mkpa ime mmụọ anyị?—Mat. 16:26.
10 N’ihi ya, ọ bụ ihe amamihe dị na ya bụ ndị mmadụ n’otu n’otu na ndị isi ezinụlọ iji nlezianya tụlee ihe ize ndụ ime mmụọ ndị zoro ezo dị na ya tupu ha ekpebie ịkwaga ma ọ bụ ịghara ịkwaga mba ọzọ n’ihi ihe metụtara akụ̀ na ụba. Ọ bụrụ na gị ma ọ bụ onye òtù ezinụlọ gị aghaghị ịkwaga mba ọzọ n’ihi ihe metụtara akụ̀ na ụba, nweta akwụkwọ iwu kwadoro nke ga-eme ọ bụghị nanị ka i nwee ike ịbanye ná mba ahụ kamakwa nwee ike inweta ọrụ n’ebe ahụ. Mgbe ahụ, ị ga-enwe ike ịgakwuru ndị Siza debere maka inye nchebe ma ọ bụrụ na ị na-enwe nsogbu ụfọdụ ndị pụrụ itinye ọnọdụ ime mmụọ gị n’ihe ize ndụ. Gị na Jehova pụrụ ịnọgide na-enwe mmekọrịta ka ị na-agbalị ‘inwe okwukwe na ezi akọ na uche, bụ́ nke ụfọdụ wezụgaworo n’akụkụ, ụgbọ ha ekpuwokwa n’ihe banyere okwukwe ha.’—1 Tim. 1:19.