Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 11/02 p. 7
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—2002
Ozi Alaeze Anyi—2002
km 11/02 p. 7

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na November: Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? ma ọ bụ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ enwetawo ndị a, a pụrụ inyefe akwụkwọ mere ochie karị. December: Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. N’ọnọdụ ya, ị pụrụ inyefe Akwukwọm nke Akukọ Bible, ma ọ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu enweghị nke ọ bụla n’ime akwụkwọ ndị ahụ a pụrụ inyefe n’ọnọdụ nke ahụ a ga-enyefe n’ọnwa ahụ, biko chọọnụ ma ọgbakọ ndị dị unu nso hà nwere nke unu pụrụ inweta iji mee ihe. January: Akwụkwọ ọ bụla e bipụtara tupu 1988 nke ọgbakọ nwere. Ọ bụrụ na unu enweghị nke ọ bụla n’ime ndị a, biko chọọnụ ma ọgbakọ ndị dị unu nso hà nwere akwụkwọ ndị ahụ meworo ochie karị ndị unu pụrụ inweta iji mee ihe.

◼ Onyeisi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ họpụtara kwesịrị ịgụzigharị ihe ndekọ ego ọgbakọ na December 1 ma ọ bụ ngwa ngwa o kwere omume mgbe ọ gasịrị. Mgbe e meworo nke a, maara ọgbakọ ọkwa mgbe a gụsịrị akụkọ ndekọ ego ọzọ.

◼ Ọgbakọ kwesịrị ịmalite ịtụ ọda mpịakọta Ụlọ Nche na Teta! maka 2002 n’ọda ọzọ ha ga-atụ. A ga-enwe mpịakọta ndị ahụ n’asụsụ Bekee. Ruo mgbe a ga-enweta ma bupụ mpịakọta ndị ahụ, ihe a ga na-ede na ha bụ “Pending” ná mpempe akwụkwọ na-egosi ihe ndị e ziteere ọgbakọ. Mpịakọta Ụlọ Nche na Teta! bụ ihe ndị a na-atụrụ ọda pụrụ iche.

◼ E kwesịrị idenye “Watch Tower Bible and Tract Society” n’akwụkwọ ndọrọ ego ndị e ji nye onyinye maka ọrụ zuru ụwa ọnụ nakwa maka Ụtụ Ego Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze.

◼ Ndị nkwusa nile kwesịrị inwetawo akwụkwọ Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke nke ha ka ọ dị ugbu a. Mmadụ nile kwesịrị ịgbalị ịmụ ya iji mara ihe ndị dị n’ime ya ná nkwadebe maka iji ya eme ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke malite na January 2003.

◼ Akwụkwọ Ọhụrụ Ndị E Nwere:

Ndịàmà Jehova—Ole Ndị Ka Ha Bụ? Gịnị Ka Ha Kweere?—Tiv

Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke—French

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya