Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na January: Akwụkwọ ọ bụla e biri tupu 1988 nke ọgbakọ nwere. Ọ bụrụ na unu enweghị nke ọ bụla n’ime ndị a, biko chọọnụ ma ọgbakọ ndị dị unu nso hà nwere akwụkwọ ndị ahụ meworo ochie karị ndị unu pụrụ inweta iji mee ihe. Ọgbakọ ndị na-enweghị akwụkwọ ndị meworo ochie karị pụrụ inyefe Mankind’s Search for God. A ga-eme mgbalị pụrụ iche ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. February na March: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. A ga-eme mgbalị pụrụ iche ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. April na May: Magazin Ụlọ Nche na Teta! Ndị nkwusa kwesịrị ịgwa ndị nwe ụlọ na ha pụrụ inye onyinye maka ọrụ ahụ zuru ụwa ọnụ ma ọ bụrụ na ha chọọ. N’ebe a chọtara onye nwere mmasị mgbe a gara nletaghachi, denye aha onye ahụ ná ndị nọ n’ụzọ magazin gị. Nyefee akwụkwọ Ihe Ọmụma ma ọ bụ broshuọ Na-achọ, n’ebumnobi nke ịmalite ọmụmụ Bible.
◼ Malite na February, n’agafeghịkwa March 2, okwu ihu ọha ọhụrụ ndị nlekọta sekit ga na-ekwu ga-abụ “Nnapụta Pụọ n’Ụwa nke Nọ n’Ọchịchịrị.”
◼ Ọgbakọ nile kwesịrị ime ndokwa ndị kwesịrị ekwesị iji mee Ememe Ncheta nke afọ a na Wednesday, April 16, mgbe anyanwụ dasịrị. Ọ bụ ezie na okwu pụrụ ịmalite n’oge karị, mbugharị nke ihe nnọchianya ndị ahụ ekwesịghị ịmalite ruo mgbe anyanwụ dasịrị. Meenụ nchọpụta n’ụlọ ọrụ ndị dị n’ógbè unu iji mara mgbe anyanwụ ji ada n’ógbè unu. N’ebe ihe karịrị otu ọgbakọ na-eji otu Ụlọ Nzukọ Alaeze eme ihe, ma eleghị anya otu ọgbakọ ma ọ bụ karị pụrụ inweta ihe owuwu ọzọ ha ga-eji mee ihe n’uhuruchi ahụ. N’ebe o kwere omume, anyị ga-atụ aro ka e nwee minit 40 ma ọ dịkarịa ala mgbe e mesịrị ihe omume tupu a malite ihe omume ọzọ ka mmadụ nile wee nwee ike irite uru zuru ezu n’ememe ahụ. E kwesịkwara ichebara ọnọdụ ngagharị na ndọwa nke ụgbọala echiche, gụnyere ibusa na iburu ndị mmadụ. Òtù ndị okenye kwesịrị ikpebi ndokwa ndị ga-akasị mma n’ógbè ha.
◼ Mgbe onyeisi oche ndị nlekọta natara akwụkwọ na-egosi ọnọdụ ihe ndekọ ego ọgbakọ site n’alaka ụlọ ọrụ n’ọnwa ọ bụla, o kwesịrị ịhụ na a gụụrụ ọgbakọ ihe ndị e dere iji gosi na a natara onyinye maka Ụtụ Ego Society Maka Ụlọ Nzukọ Alaeze nakwa maka ọrụ zuru ụwa ọnụ mgbe a ga-agụ akụkọ ndekọ ego ọzọ.
◼ Akwụkwọ Ndị E Nwere Ugbu A: Nhazi E Mere Iji Jezuo Ozi Anyị—Gun
◼ Kaseti Vidio Ndị Ọhụrụ E Nwere: Sing Praises to Jehovah—On Videocassette, Mpịakọta nke 1 na nke 2 —Ụdị Asụsụ Ogbi nke America
◼ Maka mgbakọ sekit na ụbọchị mgbakọ pụrụ iche na-abịanụ maka afọ 2003, sekit ndị na-esonụ ga-enwe ebe e debere oche iche maka ndị na-adịghị anụ ihe bụ́ ndị a ga-atụgharịrị ihe omume ahụ n’Ụdị Asụsụ Ogbi nke America (ASL):
Akabo (EE-08) March 1 na June 7-8
Akure (WE-12) March 1 na May 17-18
Badagry (WE-04) August 3 na April 19-20
Badagry (WE-23) March 2 na August 30-31
Daluwon (WE-03) March 2 na June 14-15
Enugu (EE-17) June 28 na March 8-9
Igwuruta Ali (EE-22) March 15 na August 16-17
Ilesa (WE-15) March 30 na June 21-22
Kaduna (NE-01b) March 25 na June 14-15
Ota (WE-06) March 23 na June 28-29
Ota (WE-07) March 2, na May 31-June 1
Ubogo (ME-07) August 16 na April 26-27