Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na February na March: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. A ga-eme mgbalị pụrụ iche ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. April na May: Nyefee Ụlọ Nche na Teta! Mgbe a na-aga nletaghachi na nke ndị nwere mmasị, bụ́ nke pụrụ ịgụnye ịkpọtụrụ ndị bịara Ememe Ncheta na ihe omume ndị ọzọ nke ọchịchị Chineke ma ha adịghị eso ọgbakọ akpachi anya, e kwesịrị ime mgbalị siri ike iji malite ọmụmụ Bible ebe obibi, karịsịa ma ọ bụrụ na ụfọdụ ndị enwetaworị akwụkwọ Ihe Ọmụma na broshuọ Na-achọ.
◼ Onyeisi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ họpụtara kwesịrị ịgụzigharị ihe ndekọ ego ọgbakọ na March 1 ma ọ bụ ngwa ngwa o kwere omume mgbe nke ahụ gasịrị. Mgbe e meworo nke a, maara ọgbakọ ọkwa mgbe a gụsịrị akụkọ ndekọ ego ọzọ. Gụọ ihe ọ bụla e dere iji gosi na a natara onyinye ndị ọgbakọ nyere maka ọrụ zuru ụwa ọnụ nakwa maka ụtụ ego ọ bụla ọzọ nke nzukọ a na-ahụ maka ya.
◼ Odeakwụkwọ na onye nlekọta ije ozi kwesịrị ịtụleghachi ihe ndị ọsụ ụzọ oge nile dum rụzuru. Ọ bụrụ na ọ dị onye o siiri ike ịrụtazu ọnụ ọgụgụ awa a chọrọ, ndị okenye kwesịrị ime ndokwa ka e nyere ya aka. Maka aro ụfọdụ, tụleghachi akwụkwọ ozi S-201, ndị a na-ezite kwa afọ. Leekwa paragraf nke 12-20 n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke September 1986.
◼ Isiokwu okwu ihu ọha pụrụ iche maka oge Ememe Ncheta nke 2003 ga-abụ “Oge Awa nke Ikpe nke Babilọn Ò Ruwo?” Lee ịma ọkwa yiri ya n’Ozi Alaeze Anyị nke September 2002.