Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na March: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. A ga-eme mgbalị pụrụ iche ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. April na May: Nyefee Ụlọ Nche na Teta! Mgbe a na-aga nletaghachi na nke ndị nwere mmasị, nke pụrụ ịgụnye ịkpọtụrụ ndị bịara Ememe Ncheta ma ọ bụ ihe omume ndị ọzọ nke ọchịchị Chineke ma ha adịghị eso ọgbakọ akpachi anya, lekwasị anya n’inyefe Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe. E kwesịrị ime mgbalị siri ike iji malite ọmụmụ Bible ebe obibi, karịsịa ma ọ bụrụ na ụfọdụ ndị amụworị akwụkwọ Ihe Ọmụma na broshuọ Na-achọ. June: Nyefee akwụkwọ Ihe Ọmụma ma ọ bụ broshuọ Na-achọ. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ enwetawo akwụkwọ ndị a, nyefee broshuọ ọzọ kwesịrị ekwesị nke ọgbakọ nwere.
◼ Ndị nkwusa chọrọ ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa April kwesịrị ime ndokwa ha ugbu a ma tinye akwụkwọ ha n’oge. Nke a ga-enyere ndị okenye aka ime ndokwa ndị dị mkpa maka ozi ubi ma nweta magazin na akwụkwọ ndị ọzọ otú ga-ezunụ. E kwesịrị ịdị na-amara ọgbakọ ọkwa aha ndị nile a kwadoro ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka kwa ọnwa.
◼ Isiokwu okwu ihu ọha pụrụ iche maka oge Ememe Ncheta nke 2003 ga-abụ “Oge Awa nke Ikpe Babilọn Ò Ruwo?” Lee ịma ọkwa yiri ya n’Ozi Alaeze Anyị nke September 2002.
◼ Akwụkwọ Ọhụrụ Ndị E Nwere: Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya?—Bekee, Efịk, French, Hausa, Igbo, Isoko, Tiv, Yoruba
Bịaruo Chineke Nso—Bekee, French, Hausa, Isoko, Yoruba
Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe—Bekee, Efịk, French, Hausa, Igbo, Isoko, Tiv, Yoruba
Watch Tower Publications Index, 2001—Bekee
Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe—Ná Mkpụrụ Akwụkwọ Okpotokpo—Bekee
◼ Kaseti Ndị Ọhụrụ A Na-egere Egere E Nwere:
A Satisfying Life—How to Attain It—Bekee
◼ Kaseti Vidio Ndị Ọhụrụ E Nwere: Akwukwọm nke Akukọ Bible—Na Kaseti Vidio, Mpịakọta nke 1—Ụdị Asụsụ Ogbi nke America
Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ—Na Kaseti Vidio, Mpịakọta nke 8—Ụdị Asụsụ Ogbi nke America
◼ Compact Disc Ndị Ọhụrụ A Na-egere Egere E Nwere:
Respect Jehovah’s Authority—Bekee