Ntụleghachi A Ga-eme N’ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-eji ọnụ tụlee ajụjụ ndị na-esonụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu ga-amalite n’August 25, 2003. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi ga-ewe minit 30 dabere n’ihe ndị a tụlere n’ihe omume ndị e mere n’izu July 7 ruo August 25, 2003. [Ihe Ịrịba Ama: N’ebe ndị a na-enweghị ebe e zoro aka na ha ná ngwụsị ajụjụ ọ bụla, ọ ga-adị mkpa ka i mee nnyocha nke gị iji chọta azịza ha.—Lee akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 36-37.]
NKÀ OKWU
1. Olee uru ndị ị ga-erite site n’ile onye ị na-agwa okwu anya mgbe ị na-ekere òkè n’ozi? [be-IB p. 125 para. 1-2; p. 125 igbe]
2. Ọ bụrụ na ahụ́ amalite ịma gị jijiji tupu ị malite ozi, olee ihe pụrụ inyere gị aka? [be-IB p. 128 para. 4-5]
3. Gịnị ga-enyere gị aka ikwu okwu otú i si ekwu okwu nakwa n’ụzọ mkparịta ụka n’oge ị na-ekwu okwu n’elu ikpo okwu? [be-IB p. 129 para. 2; p. 129 igbe]
4. Mmetụta dị aṅaa ka ụkpụrụ ndị dị na Levitikọs 16:4, 24, 26, 28; Jọn 13:10; na Mkpughe 19:8 kwesịrị inwe n’ọdịdị anyị, gịnịkwa mere nke a ji dị mkpa? [be-IB p. 131 para. 3; p. 131 igbe]
5. Kọwaa onye na-emeru ihe n’ókè nke nwere “uche zuru okè.” (1 Tim. 2:9, 10) [be-IB p. 132 para. 1]
IHE OMUME NKE 1
6. Ọ bụ ezie na Ndị Kraịst aghaghị iji ndidi na-anagiderịta ibe ha, gịnị ka a na-adịghị anagide n’etiti ha? (Kọl. 3:13) [w01-IB 7/15 p. 22 para. 7-8]
7. Eziokwu Ka Ọ̀ Bụ Ụgha: A na-enweta afọ ojuju site n’ibi ndụ oké ozu. [w01-IB 6/15 p. 6 para. 7–p. 7 para. 1]
8. Olee nzube kasị zie ezi anyị pụrụ inwe maka ịgụ Okwu Chineke, n’ihi gịnịkwa ka inwe nzube dị otú ahụ ji dị mkpa? [be-IB p. 24 para. 1]
9. Olee otú mmadụ ga-esi “na-akpakọba ihe ọmụma”? (Ilu 10:14) [w01-IB 7/15 p. 27 para. 4-5]
10. N’ihi gịnị ka omume ọma Job ji bụrụ ihe kwesịrị ịrịba ama? (Job 1:1, 8; 2:3) [w01-IB 8/1 p. 20 para. 4]
ỌGỤGỤ BIBLE KWA IZU
11. Olee otú ndị so n’òtù na-achị isi si nwee ike iji “otu olu kwekọrịta” na ọ bụghị iwu na ndị Jentaịl kwere ekwe ga-ebi úgwù iji bụrụ ndị a zọpụtara? (Ọrụ 15:25)
12. N’ihi gịnị ka òtù na-achị isi ga-eji gwa Pọl ka o mezuo ihe ụfọdụ Iwu Mozis kwuru ebe ọ bụ na Jehova akagbuwo Iwu ahụ? (Ọrụ 21:20-26) [it-1-E p. 481 para. 3; it-2-E p. 1163 para. 6–p. 1164 para. 1]
13. Ebubo ụgha ndị dị aṅaa e boro Pọl onyeozi na-echetara anyị ihe ndị a na-ekwu megide Ndịàmà Jehova n’oge ndị a? (Ọrụ 24:5, 6) [w01-IB 12/15 p. 22 para. 7–p. 23 para. 2]
14. Olee otú Pọl si setịpụ ihe nlereanya dị ka onye nkwusa Alaeze ọbụna n’oge ọ nọ dị ka onye e jichiri ejichi n’ụlọ ya ruo afọ abụọ? (Ọrụ 28:30, 31)
15. N’ụzọ dị aṅaa ka “ndị na-achị isi” si bụrụ “ndị Chineke doworo,” oleekwa otú nke a kwesịrị isi metụta Ndị Kraịst? (Rom. 13:1, 2) [w00-IB 8/1 p. 4 para. 5]