Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na November: Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya? December: Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. Ọ bụrụ na e nweghị ya, ị pụrụ inyefe Akwukwọm nke Akụkọ Bible, ma ọ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. January: Akwụkwọ ọ bụla e bipụtara tupu 1988 nke ọgbakọ pụrụ inwe. Ọ bụrụ na unu enweghị nke ọ bụla n’ime ndị a, biko chọọnụ ma ọgbakọ ndị dị unu nso hà nwere akwụkwọ ndị ahụ meworo ochie karị, ndị unu pụrụ iji mee ihe. Ọgbakọ ndị na-enweghị akwụkwọ ndị meworo ochie karị pụrụ inyefe Mankind’s Search for God. February: Bịaruo Jehova Nso. Ọ bụrụ na unu enweghị akwụkwọ a, unu pụrụ iji Life—How Did It Get Here? By Evolution or by Creation? ma ọ bụ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! mee ihe n’ọnọdụ ya.
◼ Onyeisi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ họpụtara kwesịrị ịgụzigharị ihe ndekọ ego ọgbakọ na December 1 ma ọ bụ ngwa ngwa December 1 gasịrị dị ka o kwere mee. Mgbe e meworo nke a, maara ọgbakọ ọkwa mgbe a gụsịrị akụkọ ndekọ ego ọzọ.
◼ Alaka ụlọ ọrụ akwadebewo fọm metụtara iwu bụ́ nke pụrụ inyekwu anyị nchebe banyere nguzo anyị n’ihe metụtara ọbara. Fọm a na-elebakwa anya n’ihe ndị ọzọ metụtara ahụ́ ike, dị ka mkpebi ndị mmadụ mere banyere ọrịa nke ga-egburịrị ya. N’ihi ya, ya na Advance Medical Directive/Release na-arụkọ ọrụ n’ime ka a mara nlekọta ahụ́ ike ndị ị họọrọ. Ọ bụghị iwu na ndị nkwusa ga-edejupụta fọm a. Ndị nwere mmasị idejupụta ya (dị ka ihe atụ, ndị na-eme atụmatụ ka a waa ha ahụ́ ma ọ bụ ndị chọrọ ime ka a mara nlekọta ahụ́ ike ndị ha họọrọ tupu ha enwee ọnọdụ ahụ́ ike ebe nke ahụ ga-adị mkpa) pụrụ inweta fọm ahụ n’aka odeakwụkwọ ọgbakọ. Ọ ga-enyekwa ha akwụkwọ bụ́ Advance Directive Guide nke nwere ajụjụ na azịza bụ́ nke na-enye nkọwa zuru ezu banyere nzube fọm ahụ na otú e si eji ya eme ihe.
◼ Akwụkwọ Ọhụrụ Ndị E Nwere:
Mpịakọta Teta! nke 2002—Bekee
Mpịakọta Ụlọ Nche nke 2002—Bekee
◼ Vidio Ndị E Nwere Ugbu A:
The Greatest Man Who Ever Lived—Vol. 9 —Ụdị Asụsụ Ogbi nke America
My Book of Bible Stories—Vol. II, III, IV —Ụdị Asụsụ Ogbi nke America
◼ CD-ROM Ọhụrụ E Nwere:
CD-ROM, Watchtower Library—2001 Edition —Bekee
◼ Akwụkwọ Ndị E Nwere Ugbu A ná Mkpụrụ Akwụkwọ Ndị Ìsì:
Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke—Bekee
Ndịàmà Jehova—Ole Ndị Ka Ha Bụ? Gịnị Ka Ha Kweere? —Bekee
Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!—Bekee
Biko dee ATTENTION: BRAILLE DESK n’elu ọda ndị a tụrụ maka akwụkwọ ndị dị ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì. Deekwa aha na adres nke onye ga-agụ ya.