Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na May: Nyefee Ụlọ Nche na Teta! Mgbe ị na-eme nletaghachi na nke ndị nwere mmasị, nke pụrụ ịgụnye ndị bịara Ememe Ncheta ma ọ bụ ndị bịara ihe omume ndị ọzọ nke ọchịchị Chineke, bụ́ ndị na-adịghị eso nzukọ a akpachi anya, lekwasị anya n’inyefe akwụkwọ Fee Chineke Ofufe. E kwesịrị ịgbalịsi ike ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi, karịsịa ma ọ bụrụ na ụfọdụ ndị amụworị akwụkwọ Ihe Ọmụma na broshuọ Na-achọ. June: Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. Ọ bụrụ na ndị mmadụ asị na ha enweghị ụmụaka, nyefee broshuọ Na-achọ. Mgbe i ji broshuọ ahụ eme ihe, lekwasị anya n’ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. July na August: A pụrụ iji nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị na-esonụ nwere peeji 32 mee ihe: Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị Ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, “Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie?, Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya?, na Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs.
◼ Onyeisi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ bụla ọ họpụtara kwesịrị ịgụzigharị ihe ndekọ ego ọgbakọ na June 1 ma ọ bụ ngwa ngwa o kwere omume mgbe nke ahụ gasịrị. Mgbe e meworo nke a, maara ọgbakọ ọkwa mgbe a gụsịrị akụkọ ndekọ ego ọzọ.
◼ E kwesịrị ide na ọ bụ “Watch Tower” ka a ga-akwụnye onyinye e nyere n’akwụkwọ ndọrọ ego ndị e tinyere n’igbe onyinye ndị dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze maka ọrụ zuru ụwa ọnụ nakwa maka Ụtụ Ego Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze.