Ntụleghachi A Ga-eme N’ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-eji ọnụ tụlee ajụjụ ndị na-esonụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu ga-amalite n’August 30, 2004. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi ga-ewe minit 30 dabere n’ihe ndị a tụlere n’ihe omume ndị e mere n’izu July 5 ruo August 30, 2004. [Ihe Ịrịba Ama: N’ebe ndị a na-enweghị ebe e zoro aka na ha ná ngwụsị ajụjụ ọ bụla, ọ ga-adị mkpa ka i mee nnyocha nke gị iji chọta azịza ha.—Lee akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 36-37.]
NKÀ OKWU
1. Olee otú anyị pụrụ isi jiri “obi dị nwayọọ na nkwanye ùgwù miri emi” kọwaa ihe mere anyị ji nwee olileanya anyị nwere? (1 Pita 3:15) [be-IB p. 192 para. 2-4]
2. Gịnị mere o ji dị mkpa iji nkwenye na-ekwu okwu? (Rom 8:38, 39; 1 Tesa. 1:5; 1 Pita 5:12) [be-IB p. 194]
3. Olee otú e si egosipụta nkwenye? [be-IB p. 195 para. 3–p. 196 para. 4]
4. Gịnị bụ akọ, n’ihi gịnị ka o ji dị mkpa, oleekwa otú anyị pụrụ isi dị akọ ma na-eguzosi ike? (Rom 12:18) [be-IB p. 197]
5. Tupu onye dị akọ ekwuo okwu, gịnị ka o kwesịrị ịtụle? (Ilu 25:11; Jọn 16:12) [be-IB p. 199]
IHE OMUME NKE 1
6. Olee otú mkparịta ụka na ọmụmụ Bible anyị pụrụ isi gosi ókè anyị nweruworo ọganihu n’eziokwu ahụ? [be-IB p. 74 para. 3–p. 75 para. 2]
7. Gịnị ka ‘ịzụpụtara onwe unu oge kwesịrị ekwesị’ pụtara, oleekwa otú anyị pụrụ isi mee nke ahụ? (Efe. 5:16) [w02-IB 11/15 p. 23]
8. Olee otú Akwụkwọ Nsọ si mee ka o doo anya na mmadụ nile hà nhata n’ihu Chineke, oleekwa otú nke a kwesịrị isi metụta ozi anyị? [w02-IB 1/1 p. 5, 7]
9. Gịnị ka aha ahụ pụrụ iche nke Onye Okike, bụ́ Jehova, pụtara? [w02-IB 1/15 p. 5]
10. Gịnị mere ka àjà Ebel “dị oké ọnụ ahịa” karịa nke Ken, oleekwa ihe anyị pụrụ ịmụta site na nke a banyere “àjà otuto” anyị? (Hib. 11:4; 13:15) [w02-IB 1/15 p. 21 para. 6-8]
ỌGỤGỤ BIBLE KWA IZU
11. Olee otú Levitikọs 18:3 pụrụ isi nyere anyị aka izere inwe echiche gbagọrọ agbagọ banyere ezi ihe na ihe ọjọọ? (Efe. 4:17-19) (w02-IB 2/1 p. 29)
12. Gịnị ka “ógbè achịcha abụọ” ahụ e chere n’ihu onyeisi nchụàjà dị ka “àjà ofufe” n’Ememe nke Izu Asaa nke Ụbọchị Asaa (Pentikọst) na-ese onyinyo ya n’ụzọ amụma? (Lev. 23:15-17) [w98-IB 3/1 p. 13 para. 21]
13. N’okwu metụtara ịkwa iko dị ka nke ahụ e kwuru n’Ọnụ Ọgụgụ isi nke 5, n’echiche dị aṅaa ka ‘apata ụkwụ’ nke nwanyị ikpe mara ‘ga-arụ arụ’? (Ọnụ Ọgụ. 5:27) [w84-IB 4/15 p. 30]
14. N’ihi gịnị ka Miriam na Erọn ji kwugide Mozis n’ihi nwunye ya bụ́ onye Etiopia? (Ọnụ Ọgụ. 12:1)
15. Gịnị bụ ‘akwụkwọ agha dị iche iche nke Jehova’? (Ọnụ Ọgụ. 21:14)