Wetara Onye Kere Gị Otuto Site n’Isetịpụ Ihe Mgbaru Ọsọ Ime Mmụọ
1. (a) Olee otú ndụ pụrụ isi nwee nzube? (b) Ihe mgbaru ọsọ ndị dị aṅaa ka Noa na Mozis nwere?
1 Ka ndụ wee nwee nzube, ihe mgbaru ọsọ dị oké mkpa. Bible nwere ihe atụ nke ndị setịpụụrụ onwe ha ihe mgbaru ọsọ. Noa rụrụ ọrụ ruo ihe dị ka afọ 50 iji wuo ụgbọ. Gịnị bụ ihe mgbaru ọsọ ya? Ọ bụ “maka ịzọpụta ezinụlọ ya.” Mozis onye amụma “legidere anya n’ụgwọ ọrụ a ga-akwụ ya.”—Hib. 11:7, 26.
2. Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?
2 Ee, ndị ohu Jehova dịrị ndụ n’ọgbọ ndị gara aga esetịpụworo onwe ha nnukwu ihe mgbaru ọsọ ma ruokwa ha, n’ụzọ wetaara Ya otuto. Olee otú anyị onwe anyị taa pụrụ isi setịpụ ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ iji wetara Onye kere anyị otuto? Ihe mgbaru ọsọ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ ịgbalịsi ike iru, oleekwa ihe ndị dị mkpa anyị pụrụ ime iji ruo ha?
3. Olee ụzọ ndị ihe mgbaru ọsọ ọchịchị Chineke si dị iche n’ebe ihe mgbaru ọsọ ụwa dị?
3 Nwee Ebumnobi Ziri Ezi: Ihe mgbaru ọsọ ọchịchị Chineke na oké ọchịchọ nke ụwa abụghị otu ihe. Nzube bụ́ isi e ji enwe ọtụtụ ihe mgbaru ọsọ n’ụwa bụ ọchịchọ siri ike nke ịba ọgaranya na ọchịchọ a na-apụghị imejụ emejụ maka ọkwá na ikike. Ma, ihe mgbaru ọsọ ndị na-ewetara Jehova Chineke otuto, ofufe anyị na-efe ya, na ihe ndị metụtara Alaeze ahụ, nwere njikọ kpọmkwem. (Mat. 6:33) Ihe mgbaru ọsọ ndị dị otú ahụ na-esite n’ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke na mmadụ ibe anyị nọ, nzube ha na-abụkwa iji nye Chineke nsọpụrụ.—Mat. 22:37-39; 1 Tim. 4:7.
4, 5. Olee ihe mgbaru ọsọ ụfọdụ anyị pụrụ ichebara echiche?
4 Ihe Mgbaru Ọsọ Ime Mmụọ Ndị E Kwesịrị Ichebara Echiche: Ị pụrụ isetịpụ ihe mgbaru ọsọ nke ịmụba ihe ọmụma gị n’Okwu Chineke. N’Ilu 2:1-5, a na-adụ anyị ọdụ ‘ịchọ ihe ọmụma Chineke.’ Site n’inwechi ọmụmụ ihe onwe onye anya, ị na-eme ka ihe ọmụma dabeere n’Akwụkwọ Nsọ, bụ́ ndị e dere iji mee ka ị bịarukwuo Jehova nso, bamie n’obi gị. Ị ga-abụ onye nwekwuru ike ime mkpebi mgbe ihe ndị dị mkpa chere gị ihu.
5 Ụfọdụ ndị nwere ihe mgbaru ọsọ nke iji ọnụ ọgụgụ oge a kapịrị ọnụ jee ozi kwa izu. Ihe mgbaru ọsọ gị ọ̀ bụ ịghọ onye ozizi nwere nkà karị ná nletaghachi nakwa n’ọmụmụ Bible ebe obibi? Ụfọdụ ndị nọ n’ụlọ akwụkwọ esetịpụwo ihe mgbaru ọsọ nke ịbụ ndị ọsụ ụzọ inyeaka n’otu oge ezumike ma ọ bụ karị kwa afọ. Gịnịkwanụ banyere magazin Ụlọ Nche na Teta!? Ụfọdụ ndị esetịpụwo ihe mgbaru ọsọ nke ịgụ mbipụta ọ bụla ozugbo ha nwetara ya.
6. Olee ụfọdụ n’ime ihe ndị anyị pụrụ ime iji nyere anyị aka iru ihe mgbaru ọsọ anyị?
6 Idetu Ihe Mgbaru Ọsọ Anyị Edetu Pụrụ Inyere Anyị Aka Iru Ha: Solomọn kwuru na okwu ndị kwesịrị ekwesị pụrụ ịdị ike dị ka ndụdụ e ji achụ ehi n’ime ka ndụ nwee nzube. (Ekl. 12:11) Mgbe e deturu okwu ndị ahụ edetu, a dịghị echefu ha ngwa ngwa. (Deut. 17:18) Ya mere, anyị pụrụ ịchọ idetu ihe mgbaru ọsọ anyị na ụzọ ndị anyị ga-esi eru ha edetu, na-edepụta ihe mgbochi ndị anyị na-atụ anya ha nakwa ụzọ ndị anyị ga-esi merie ha.
7. Olee otú otu onye ọsụ ụzọ pụrụ iche si ruo ihe mgbaru ọsọ ya?
7 Tụlee ihe atụ nke otu onye bụworo ọsụ ụzọ pụrụ iche ruo ogologo oge n’ókèala dịpụrụ adịpụ bụ́ onye nwunye ya nwụrụ na mberede. Mgbe o mesịrị mgbanwe n’ihe ụfọdụ, o kpebiri imikpu onwe ya kpam kpam n’ozi ọsụ ụzọ ya site n’isetịpụ ihe mgbaru ọsọ. Mgbe o detusịrị atụmatụ ya n’akwụkwọ, o kpere ekpere ma malite ime mgbalị iji malite ọmụmụ Bible ọhụrụ atọ ka ọ ga-erule ná ngwụsị nke ọnwa ahụ. Kwa ụbọchị, ọ na-atụle ihe ndị ọ rụrụ, ụbọchị iri ọ bụlakwa, ọ na-atụle ọganihu ndị o nweworo. Ò ruru ihe mgbaru ọsọ ya? N’ịbụ onye nyere akụkọ ozi nke bu ọmụmụ Bible ndị ọhụrụ anọ, o ji ọṅụ zaa ee!
8. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?
8 Otú ọ dị, ọnọdụ ụfọdụ nwere ike ime ka ịchụso ihe mgbaru ọsọ ụfọdụ bụrụ ihe na-agaghị ekwe omume. Dị ka ihe atụ, ahụ́ esighị ike ma ọ bụ ibu ọrụ ezinụlọ pụrụ ime ka anyị ghara iru ihe mgbaru ọsọ ụfọdụ. Ka o sina dị, anyị ka pụrụ ‘ịtụ egwu Chineke, debekwa ihe nile O nyere n’iwu.’ (Ekl. 12:13) Ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ na-enyere anyị aka ilekwasị anya n’ime uche Chineke. Ya mere, ka anyị jiri ha mee ihe n’iwetara Onye kere anyị otuto.