Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 11/04 p. 3
  • Igbe Ajụjụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Igbe Ajụjụ
  • Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Mere Anyị Ka Ji Kwesị Ịna-adị Umeala n’Obi
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • Ị Ga-adịli Umeala n’Obi ma Mgbe O Siri Ike Ime Otú Ahụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • Otú Ị Ga-esi Na-enwe Obi Ụtọ ma Ozi Ị Na-eje Gbanwee
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • “N’ebe Ndị Maara Ebe Ike Ha Ruru Nọ Ka Amamihe Dị”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2004
km 11/04 p. 3

Igbe Ajụjụ

◼ Olee otú anyị kwesịrị isi na-ahụ maka ọrụ ndị e nwere n’ọgbakọ?

Ọgbakọ ndị Jehova na-arụ ọrụ nke ọma n’ihi mgbalị e jikọrọ aka na-eme. (1 Kọr. 14:33, 40) Cheedị ihe ọ na-ewe iji nwee nanị otu nzukọ ọgbakọ. E wezụga usoro ihe omume ahụ n’onwe ya, e nwere ọtụtụ ọrụ a na-arụ tupu na mgbe a gbasasịrị nzukọ, ka ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị na-ahụ maka ibu ọrụ dị iche iche. Ọrụ ndị ọzọ a na-arụ, bụ́ ndị ndị ọzọ na-adịghị ahụ, dịkwa mkpa. Olee otú onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ isi kwadoo ndokwa a?

Wepụta onwe gị. Ndị nwere mmụọ afọ ofufo ga-ahụ ọtụtụ ihe ha ga-eme. (Ọma 110:3) Gosi mmetụta n’ebe ndị ahụ́ na-adịghị na ndị agadi nọ. Na-enye aka n’idebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha. Anyị pụrụ ịrụ ọtụtụ ọrụ bara uru n’echeghị ka a gwa anyị agwa. Nanị ihe dị anyị mkpa bụ inwe ọchịchọ inye aka.

Mara ebe ike gị ruru ka ị na-eje ozi. Ndị maara ebe ike ha ruru na-enwe obi ụtọ ijere ndị ọzọ ozi. (Luk 9:48) Ịma ebe ike anyị ruru ga-egbochi anyị iwere ọrụ karịa ókè anyị ga-arụchali. Ọzọkwa, ịmara ebe ike anyị ruru ga-eme ka anyị ghara ime ihe ndị na-erughịrị anyị ime.—Ilu 11:2.

Bụrụ onye a pụrụ ịtụkwasị obi. A gbara Mozis ume ịhọrọ “ndị na-ekwu eziokwu” ịnọ n’ọnọdụ nke ibu ibu ọrụ n’Izrel oge ochie. (Ọpụ. 18:21) A chọkwara otu àgwà a taa. Jiri ịdị uchu na-elekọta ọrụ ọ bụla e nyere gị. (Luk 16:10) Ọ bụrụ na i nweghị ike ịrụ ọrụ gị, hụ na e mere ndokwa kwesịrị ekwesị ka onye ọzọ hụ maka ya mgbe ị na-anọghị ya.

Na-eme ihe nile i nwere ike ime. A na-agba Ndị Kraịst ume iji obi dum na-arụ ọrụ ọbụna n’ọrụ ego ha. (Kọl. 3:22-24) E nwere ihe ka mkpa mere anyị ga-eji na-eme otú ahụ mgbe anyị na-arụ ọrụ iji mee ka ezi ofufe na-aga n’ihu. Ọ bụrụgodị na otu ọrụ eyie ihe dị ala ma ọ bụ ihe na-abaghị uru, ọ na-ewetara ọgbakọ ngọzi mgbe a rụrụ ya nke ọma.

Ọrụ ọ bụla na-enye anyị ohere igosipụta ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova na ụmụnna anyị nọ. (Mat. 22:37-39) Ka anyị jiri ikwesị ntụkwasị obi na-ahụ maka ọrụ ọ bụla e nyere anyị.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya