Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na September: A ga-enyefe akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso. Ọ bụrụ na e nweghị ya, ị pụrụ inyefe akwụkwọ Amụma Daniel ma ọ bụ broshuọ Nọrọ na Nche. October: A ga-enyefe magazin Ụlọ Nche na Teta! n’ọnwa ahụ nile. N’ebe e gosiri mmasị, biko webata broshuọ Na-achọ, ma gaghachi iji malite ọmụmụ Bible ebe obibi. November: Nyefee akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. Ọ bụrụ na ndị mmadụ asị na ha enweghị ụmụaka, nyefee akwụkwọ Ihe Ọmụma ma ọ bụ traktị bụ́ Ị̀ Ga-achọ Ịmatakwu Banyere Bible? December: Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. Ọ bụrụ na e nweghị ya, ị pụrụ inyefe Akwụkwọm nke Akụkọ Bible, ma ọ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala.
◼ Alaka ụlọ ọrụ adịghị ahụ maka ọda akwụkwọ nke ndị nkwusa n’otu n’otu. Onyeisi oche ndị nlekọta kwesịrị ime ndokwa ka a na-ama ọkwa kwa ọnwa tupu a na-ezigara alaka ụlọ ọrụ ọda akwụkwọ nke ọgbakọ bụ́ nke a na-eziga kwa ọnwa, ka ndị nile nwere mmasị inweta akwụkwọ nke onwe ha nwee ike ịgwa nwanna na-elekọta akwụkwọ. Biko buru n’uche akwụkwọ ndị bụ́ ndị a na-atụrụ ọda pụrụ iche.
◼A na-echetara ndị okenye ka ha gbasoo ntụziaka ndị e nyere na peeji nke 21-23 nke Ụlọ Nche April 15, 1991, banyere ndị ọ bụla a chụpụrụ n’ọgbakọ ma ọ bụ ndị kewapụrụ onwe ha, bụ́ ndị pụrụ ịchọ ka a nabataghachi ha.
◼ A ga-ekwu okwu ihu ọha pụrụ iche maka oge Ememe Ncheta nke afọ 2006 na Sunday, April 30. A ga-ama ọkwa isiokwu nke okwu ihu ọha ahụ ka oge na-aga. Ọgbakọ ndị ga-enwe onye nlekọta sekit ma ọ bụ mgbakọ ná ngwụsị izu ahụ, ga-ekwu okwu ihu ọha ahụ pụrụ iche n’izu nke na-esonụ. Ọ dịghị ọgbakọ kwesịrị ikwu ya tupu Sunday, April 30, 2006.
◼ N’ime afọ ije ozi 2006, a ga-ekwe ka ndị nile na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa onye nlekọta sekit letara ọgbakọ ha sonye n’ọkara mbụ nke nzukọ onye nlekọta sekit na ndị ọsụ ụzọ ga-enwe n’izu ahụ. A na-agba ndị nile pụrụ ime otú ahụ ume irite uru ná ndokwa a pụrụ iche.
◼ Compact Disc Ọhụrụ A Na-egere Egere E Nwere:
Warning Examples for Our Day—Bekee