Ntụleghachi A Ga-eme N’ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-eji ọnụ zaa ajụjụ ndị na-esonụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu ga-amalite October 31, 2005. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi ga-ewe minit 30 dabere n’ihe ndị a tụlere n’ihe omume ndị e mere n’izu September 5 ruo October 31, 2005. [Ihe Ịrịba Ama: N’ebe ndị a na-enweghị ebe e zoro aka na ha ná ngwụsị ajụjụ ọ bụla, ọ ga-adị mkpa ka i mee nnyocha nke gị iji chọta azịza ha.—Lee akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 36-37.]
NKÀ OKWU
1. Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na ihe ndị anyị si n’Okwu Chineke na-ezi ndị mmadụ na-eru n’obi ihe atụ ha? (Mat. 13:19) [be-IB p. 258 para. 1-2, igbe]
2. Gịnị pụrụ inyere anyị aka ịjụpụta ihe dị mmadụ n’obi, gịnịkwa ka anyị na-aghaghị ilezi anya ka anyị ghara ime? [be-IB p. 259 para. 2-3]
3. Mgbe anyị na-ezi ihe, gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị dọrọ uche gaa n’àgwà Jehova ndị magburu onwe ha? [be-IB p. 260 para. 1]
4. Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị anyị na-amụrụ Bible aka ịmata ebe ndị ha kwesịrị imeziwanye? [be-IB p. 260 para. 4–p. 261 para. 1]
5. Olee ihe anyị pụrụ ime iji nyere ndị anyị na-amụrụ Bible ma ọ bụ ndị na-ege anyị ntị aka inyocha ihe ha bu n’obi na-eme ihe ndị ha na-eme? [be-IB p. 262 para. 2-3]
IHE OMUME NKE 1
6. Gịnị ka ‘ịchọsi Jehova ike’ pụtara, oleekwa otú anyị pụrụ isi gosi na anyị na-eme otú ahụ? (Hib. 11:6) [w03-IB 8/15 p. 25 para. 2; p. 26 para. 1-2; p. 27 para. 2]
7. Gịnị bụ “ụkpụrụ nke okwu na-enye ezi ndụ,” oleekwa otú ndị okenye pụrụ isi na-egosi na ha na-ejisi ya ike? (2 Tim. 1:13, 14) [w03-IB 1/1 p. 29 para. 3–p. 30 para. 1]
8. Gịnị mere Chineke ebibighị di na nwunye mbụ ahụ bụ́ mmadụ nakwa Setan, bụ́ onye a na-adịghị ahụ anya nke kpalitere nnupụisi ha, ozugbo ahụ? [w03-IB 1/1 p. 5 para. 3]
9. Olee ihe bụ́ echiche kwesịrị ekwesị e kwesịrị inwe banyere ọrụ, echiche dịkwa otú ahụ ọ̀ na-akwado ịdị umengwụ? (Ilu 20:4) [w03-IB 2/1 p. 5 para. 1-2]
10. Ò ziri ezi mgbe nile mmadụ ịnọgidesi ike n’okpukpe ndị mụrụ ya na-ekpe? [w03-IB 4/15 p. 5 para. 3–p. 6 para. 2]
ỌGỤGỤ BIBLE KWA IZU
11. 2 Ndị Eze 13:21 ọ̀ na-akwado ife ihe ndị e ji echeta ndị nsọ ofufe?
12. Ọ̀ dị mgbe Hezekaịa so Ijipt nwee nkwekọrịta? (2 Eze 18:19-21, 25)
13. N’agbanyeghị na ihe ndekọ ndị Asiria akpọtụghị mmeri ahụ dị ịrịba ama Jehova meriri Senakerib aha kpọmkwem, olee ihe masịrị gị n’ihe ndekọ ahụ? (2 Eze 19:35, 36)
14. Ònye bụ nna Shealtiel? (1 Ihe 3:16-18)
15. N’oge Eze Sọl, olee otú ebo Ruben, Gad, na ọkara ebo Manase si setịpụrụ ndị ohu Chineke taa ezi ihe nlereanya? (1 Ihe 5:18-22)