Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na November: Nyefee akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. Ọ bụrụ na ndị mmadụ asị na ha enweghị ụmụaka, nyefee akwụkwọ Ihe Ọmụma ma ọ bụ traktị bụ́ Ị̀ Ga-achọ Ịmatakwu Banyere Bible? December: Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. Ọ bụrụ na e nweghị ya, ị pụrụ inyefe Akwụkwọm nke Akụkọ Bible, ma ọ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. January: A pụrụ inyefe akwụkwọ ọ bụla dị peeji 192 nke e biri n’akwụkwọ na-achanwụ achanwụ nke ọgbakọ nwere. Ọ bụrụ na e nweghị ha, ị pụrụ inyefe akwụkwọ bụ́ Mankind’s Search for God, ma ọ bụ broshuọ Nọrọ na Nche! February: A ga-enyefe akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso. Ọ bụrụ na e nweghị ya, ị pụrụ inyefe Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso ma ọ bụ akwụkwọ ọ bụla ka ya mee ochie unu nwejuru enweju.
◼ Onyeisi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ bụla ọ họpụtara kwesịrị inyocha ihe ndekọ ego ọgbakọ na December 1 ma ọ bụ ngwa ngwa o kwere mee. Ọ bụrụ na unu nwere ihe ndekọ ego dị iche, dị ka nke ego e ji elekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ nke ego ihe owuwu, e kwesịkwara ime ndokwa ka e nyochaa ya. Mgbe e meworo nke a, e kwesịrị ịmara ọgbakọ ọkwa ya mgbe a gụsịrị akụkọ ndekọ ego ọzọ.
◼ N’akwụkwọ ndọrọ ego ọ bụla e nyere n’onyinye bụ́ nke e tinyere n’igbe onyinye ndị dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze maka ọrụ zuru ụwa ọnụ nakwa maka iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, e kwesịrị ide “Watch Tower” dị ka ndị ọ bụ ha ga-adọrọ ego ahụ. Ọzọkwa, akwụkwọ ndọrọ ego ọ bụla e nyere n’onyinye ná mgbakọ distrikti nakwa ndị nke e zigara n’alaka ụlọ ọrụ bụ “Watch Tower” ka e kwesịrị ide dị ka ndị ga-adọrọ ego ahụ. Adres alaka ụlọ ọrụ ji ahụ maka ihe ndị metụtara ego bụ Watch Tower Bible and Tract Society (Ltd/Gte), P.M.B. 1090, Benin City 300001, Edo State.