Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na March: Nyefee akwụkwọ ọhụrụ ahụ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Gbalịsie ike ịmalite ọmụmụ Bible. April na May: Nyefee Ụlọ Nche na Teta! Mgbe ị na-eme nletaghachi na nke ndị nwere mmasị, tinyere ndị bịara ihe omume e ji echeta ọnwụ Jizọs ma ọ bụ ndị bịara ya ma na-abịakwa nzukọ anyị ndị ọzọ, ma ha adịghị eso ọgbakọ akpachi anya, lekwasị anya n’inyefe akwụkwọ ọhụrụ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Nzube anyị kwesịrị ịbụ iji akwụkwọ ahụ malite ọmụmụ Bible. June: Nyefee akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. Ọ bụrụ na ndị mmadụ asị na ha enweghị ụmụaka, nyefee akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ.
◼ Ebe ọ bụ na e nwere ngwụsị izu ise zuru ezu n’ọnwa April, ọ ga-abụ ọnwa magburu onwe ya ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka.
◼ A ga-eme ihe omume e ji echeta ọnwụ Jizọs na Wednesday, April 12, 2006. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu na-amụ ihe n’ụbọchị Wednesday, bufeenụ ya n’ụbọchị ọzọ n’izu ahụ ma ọ bụrụ na ohere ga-adị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze unu. Ọ bụrụ na ohere agaghị adị, ya abụrụkwa na nke a ga-emetụta Nzukọ Ije Ozi, unu pụrụ ime akụkụ ndị nke metụtara ọgbakọ unu ná Nzukọ Ije Ozi ọzọ.
◼ A ga-atụle vidio bụ́ Noah—He Walked With God ná Nzukọ Ije Ozi n’ọnwa May. Ọ bụrụ na ọ dị onye chọrọ ya, o kwesịrị isi n’aka ọgbakọ tụọ ọda ya ngwa ngwa o kwere mee.
◼ Mgbe ọ bụla ị na-eme atụmatụ ịga mba ọzọ ma na-atụ anya iso ndị ebe ahụ gaa nzukọ ọgbakọ, mgbakọ sekit, mgbakọ pụrụ iche, ma ọ bụ mgbakọ distrikti, ọ bụ alaka ụlọ ọrụ na-elekọta ọrụ ná mba ahụ ka ị na-aghaghị ịjụ ajụjụ iji mata ụbọchị, oge, na ebe ndị a na-enwe nzukọ ma ọ bụ mgbakọ nke ọ bụla. E depụtara adres alaka ụlọ ọrụ dị iche iche na peeji ikpeazụ nke Yearbook kasị ọhụrụ.
◼ A ga-ekwu okwu ihu ọha pụrụ iche maka oge ihe omume e ji echeta ọnwụ Jizọs, nke afọ 2006, n’ụbọchị Sunday, April 30. Isiokwu ya ga-abụ, “Ọ̀ Bụ Chineke Ka Na-achịkwa Ihe Ndị Na-eme n’Ụwa?”
◼ Ná mgbakọ sekit na nke pụrụ iche a ga-enwe n’afọ 2006, sekit ndị na-esonụ ga-enwe ebe e debeere ndị ntị chiri oche. A ga-eji asụsụ ndị ogbi tapịara ha usoro ihe omume ahụ:
Akabo (EE-08) April 15-16 na July 16
Akure (WE-12) March 4 na August 5-6
Badagry (WE-04) April 1-2 na August 5
Badagry (WE-23) May 20-21 na August 6
Calabar (EE-21) May 27-28 na September 10
Daluwon (WE-01) March 19 na July 15-16
Daluwon (WE-03) March 18 na August 5-6
Daluwon (WE-13) April 9 na September 2-3
Daluwon (WE-22) May 20 na September 9-10
Enugu (EE-17) May 6 na September 2-3
Enugu (EE-19) May 7 na September 9-10
Ibadan (WE-10) May 27-28 na August 20
Igwuruta Ali (EE-22) May 13 na August 12-13
Ilesa (WE-15) March 18-19 n’Akure; June 25 n’Ilesa
Kaduna (NE-01b) May 20-21 na August 26
Ota (WE-06) April 15-16 na July 15
Ota (WE-07) March 18-19 na June 25
Uli (EE-24) March 5 na June 17-18
Uyo (EE-20) May 6 na September 23-24
◼ Akwụkwọ Ọhụrụ Ndị E Nwere:
Teta! (Mpịakọta nke 2004)—Bekee
Bịaruo Jehova Nso—Tiv
Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!—Ná Mkpụrụ Akwụkwọ Okpotokpo —Bekee
Ụlọ Nche (Mpịakọta nke 2004) —Bekee
◼ Kaseti Ọhụrụ A Na-egere Egere E Nwere:
Bịaruo Jehova Nso (kaseti asatọ dị n’otu ọ́bọ́) —Bekee
◼ Compact Disc Ọhụrụ E Nwere:
Watchtower Library—2004 Edition —Bekee