Ị̀ Na-ajụ Ma È Nwere Ndị Ọzọ Ga-enwe Mmasị Ka A Mụwara Ha Ihe?
Ọ bụrụ na o nwere onye ị na-eduziri ọmụmụ Bible ugbu a, í cheghị na ọ ga-adị mma ma ị jụọ ya ma è nwere ndị enyi ya, ndị ikwu ya, ma ọ bụ ndị ọzọ ọ maara ga-achọ iso ya na-amụta ihe Bible na-akụzi. Ọtụtụ mgbe a jụrụ ụdị ajụjụ a, aha ndị a na-enweta na-adị ọtụtụ. Ọ bụrụ na onye ahụ ị na-eduziri ọmụmụ Bible ga-ekwe, ị pụrụ ịkpọ ya aha mgbe ị gara n’ụlọ ndị ahụ ịgwa ha ka i duziwere ha ọmụmụ Bible. I nwere ike ịsị, “[Aha onye ahụ ị na-eduziri ọmụmụ ihe] anọọla na-amụ Bible, o chekwara na ị ga-enwe mmasị iso rite uru n’ọmụmụ Bible a anyị na-eduzi n’efu.” I kwusịa nke ahụ, i jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi gosi ya, n’ụzọ dị nkenke, otú anyị si amụ ihe.
Ọ bụrụ na i nwere onye ị na-amụrụ ihe nke na-eme nke ọma, i nwere ike ịgwa ya ka ọ kọwaara ndị enyi ya na ndị ezinụlọ ya ga-enwe mmasị otú anyị si amụrụ ndị mmadụ Bible. O nwere ike ịkpọ ha ka ha bịa nọrọ ya mgbe ị na-amụrụ ya ihe. Ọ bụrụ na ha agaghị abịali, o nwere ike ime ndokwa ka ị gakwuru ha iji gosi ha otú e si amụ Bible. Nke a ga-agba onye ahụ ị na-eduziri ọmụmụ Bible ume ịmalite ịgwa ndị ọzọ ihe ndị ọ na-amụta na Bible.
Ndị ị na-aga nletaghachi na nke ha mgbe nile nwekwara ike ịgwa gị ndị ọzọ ị ga-agakwuru, ọbụna ma a sị na ha onwe ha ekwetabeghị ka i duziwere ha ọmụmụ Bible mgbe nile. Mgbe i nyefere ha akwụkwọ Bible Na-akụzi, i nwere ike ịjụ ha, sị, “Ọ̀ dị onye ọzọ ị maara ga-achọ inweta akwụkwọ a?”
Ebe ọ bụ na oge a bụ oge chọrọ ka e mee ihe ngwa ngwa, anyị chọrọ iji ohere ọ bụla dapụtaranụ nyere ndị mmadụ aka ịnụ na ịnakwere ozi ọma ahụ. Ị̀ na-ajụ ma è nwere ndị ọzọ ga-enwe mmasị ka a mụwara ha ihe?