Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 4/06 p. 2-7
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—2006
Ozi Alaeze Anyi—2006
km 4/06 p. 2-7

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ a ga-enyefe n’ọnwa April na May: Nyefee Ụlọ Nche na Teta! Mgbe ị na-eme nletaghachi na nke ndị nwere mmasị, tinyere ndị bịara ihe omume e ji echeta ọnwụ Jizọs ma ọ bụ ndị bịara ya ma na-abịakwa nzukọ anyị ndị ọzọ, ma ha adịghị eso ọgbakọ akpachi anya, lekwasị anya n’inyefe akwụkwọ ọhụrụ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Nzube anyị kwesịrị ịbụ iji akwụkwọ ahụ malite ọmụmụ Bible. June: Nyefee akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. Ọ bụrụ na ndị mmadụ asị na ha enweghị ụmụaka, nyefee akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ.

◼ Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ịhụ mgbe nile na ọgbakọ nwere fọm Application for Regular Pioneer Service (S-205) na Application for Auxiliary Pioneer Service (S-205b), ole ga-ezuru ha. A pụrụ iji fọm Literature Request Form (S-14) tụọ ọda ha. Hụ na ọgbakọ nwere, ọ dịkarịa ala, nke ga-ezu otu afọ. Tupu e zitere alaka ụlọ ọrụ fọm maka ọrụ ọsụ ụzọ oge nile, hụnụ na e dejupụtara ha nke ọma.

◼ Ọ dị mkpa ka alaka ụlọ ọrụ nwee ihe ndekọ kasị ọhụrụ nke adres na nọmba telifon nke ndị isi oche ndị nlekọta na ndị odeakwụkwọ nile. Ọ bụrụ na e nwee mgbanwe n’oge ọ bụla, Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ kwesịrị idejupụta fọm Presiding Overseer/Secretary Change of Address (S-29), bịanye aka na ya, ma zitere ya alaka ụlọ ọrụ ozugbo. Nke a na-agụnye mgbanwe ọ bụla e nwere na nọmba telifon.

◼ E kwesịrị inye ndị nọ n’ọgbakọ Ụlọ Nche na Teta! ndị kasị ọhụrụ ozugbo e nwetara ha. Nke a ga-eme ka ndị nkwusa mara ihe ndị dị n’ime ha tupu ha amalite inyefe ha n’ozi ubi. E kwesịkwara inye ndị nkwusa Ozi Alaeze Anyị ozugbo e nwetara ya. A pụrụ inye ha ya n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ.

◼ Alaka ụlọ ọrụ adịghị ahụ maka ọda akwụkwọ nke ndị nkwusa n’otu n’otu. Onyeisi oche ndị nlekọta kwesịrị ime ndokwa maka ịma ọkwa kwa ọnwa tupu e zigara alaka ụlọ ọrụ ọda akwụkwọ nke ọgbakọ kwa ọnwa ka ndị nile nwere mmasị inweta akwụkwọ nke onwe ha nwee ike ịgwa nwanna na-elekọta akwụkwọ. Biko buru n’uche akwụkwọ ndị a na-atụrụ ọda pụrụ iche.

◼ Na May 27, 2006, a ga-emechi alaka ụlọ ọrụ dị n’Igieduma. N’ihi ya, biko unu abịala nleta ma ọ bụ inweta akwụkwọ n’ụbọchị ahụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya