Akwụkwọ Ozi Sitere n’Aka Òtù Na-achị Isi
“NWEENỤ obiọma na-erughịrị mmadụ na udo sitere n’aka Chineke bụ́ Nna anyị nakwa Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.” Otú a ka Pọl si kelee ụmụnna n’ọtụtụ akwụkwọ ozi ndị o degaara ọgbakọ dị iche iche. Ọ bụkwa otú ahụ ka anyị chọrọ ka ọ dịrị unu nile.—Efe. 1:2.
Anyị nwere ekele dị ukwuu maka obiọma na-erughịrị mmadụ nke Jehova gosipụtara site n’àjà mgbapụta nke Kraịst Jizọs! Ihe mgbapụta ahụ emewo ka anyị na Chineke dị ná mma. Anyị na Chineke apụghị ịdị ná mma site n’ike nke onwe anyị, n’agbanyeghị ókè anyị pụrụ itinyeru mgbalị n’ịmụ Bible, n’ikwusa ozi ọma, ma ọ bụ n’ịrụ ezi ọrụ ndị ọzọ. Mgbaghara a gbaghaara anyị mmehie anyị na ohere e nyere anyị ịdị ndụ ebighị ebi abụghị ihe e ji kwụọ anyị ụgwọ maka mgbalị anyị na-eme kama ọ bụ onyinye na-egosipụta obiọma na-erughịrị mmadụ nke Jehova gosipụtara site n’aka Jizọs Kraịst.—Rom 11:6.
Pọl degaara ndị kwere ekwe ibe ya akwụkwọ, sị: “Anyị na-arịọsikwa unu ike ka unu ghara ịnara obiọma na-erughịrị mmadụ nke Chineke ma nzube ya efunahụ unu. N’ihi na ọ na-asị: ‘N’oge a na-anara mmadụ nke ọma, anụrụ m olu gị, n’ụbọchị nzọpụta kwa, enyeere m gị aka.’ Lee! Ugbu a bụ oge a na-anara mmadụ nke ọma karịsịa. Lee! Ugbu a bụ ụbọchị nzọpụta.” E nwere ‘oge a na-anara mmadụ nke ọma’ tupu e bibie Jeruselem na narị afọ mbụ. Ndị nwere obi eziokwu, bụ́kwa ndị hụrụ Jehova n’anya, bụ ndị a zọpụtara n’ụdị na ha nwetara ihu ọma ya. Nke a mesịrị mee ka a zọpụta ndị ahụ nile kwesịrị ntụkwasị obi n’ụzọ nkịtị, bụ́ ndị si na Jeruselem gbapụ tupu e bibie ya n’afọ 70 O.A.—2 Kọr. 6:1, 2.
Taa kwa, anyị na-ebi “n’oge a na-anara mmadụ nke ọma” nakwa “n’ụbọchị nzọpụta.” Ndị Jehova na-anara dị ka ndị ohu ya na ndị a na-azọpụta n’ụzọ ime mmụọ nwere olileanya nke ịlanarị “oké ụbọchị Jehova” nke dị nnọọ nso ugbu a.—Zef. 1:14.
Ọbịbịa nke ụbọchị Jehova na-ewetara anyị ibu ọrụ dị ezigbo mkpa. Ọrụ anyị bụ ma ịdọ ndị mmadụ aka ná ntị banyere ụbọchị Jehova ma inyere ndị nwere obi eziokwu aka irite uru n’obiọma na-erughịrị mmadụ nke Jehova ka e wee nwee ike ịzọpụtakwa ha. Pọl ji ibu ọrụ a kpọrọ ihe nke ukwuu. O dere, sị: “N’ezie, ahụhụ dịịrị m ma ọ bụrụ na akpọsaghị m ozi ọma!” O gosipụtakwara otú ọ dị ya n’obi mgbe o kwuru, sị: ‘Eji m ma ndị maara ihe ma ndị na-amaghị ihe ụgwọ: ya mere enwere m ọchịchọ siri ike ịkpọsakwara unu ozi ọma.’—1 Kọr. 9:16; Rom 1:14, 15.
Jehova ga-ajụ anyị ajụjụ ma ọ bụrụ na anyị eleghara ọrụ ahụ dị oké mkpa nke bụ́ ịdọ ndị mmadụ aka ná ntị anya. Anyị maara ihe Jehova gwara Ezikiel onye amụma: “Nwa nke mmadụ, ọ bụ onye nche ụlọ Izrel ka m mere gị, ị ga-anụkwa okwu n’ọnụ m, ị ga-adọkwa ha aka ná ntị dị ka m gwara gị. Mgbe m sịrị onye ajọ omume, ‘Ị ghaghị ịnwụ,’ ma ị dọghị ya aka ná ntị, i kwughịkwa okwu iji dọọ onye ajọ omume ahụ aka ná ntị ka ọ hapụ ụzọ ọjọọ ya ka e wee debe ya ndụ, ebe ọ bụ na ọ bụ onye ajọ omume, ọ ga-anwụ ná njehie ya, ma n’aka gị ka m ga-ajụta ọbara ya.”—Ezik. 3:17, 18
Ụbọchị ikpeazụ ndị a siri ike obibi. Ọ naghị adị mfe ịrụ ọrụ ezinụlọ, ịrụ ọrụ ego, ịrụ ọrụ ọgbakọ, ma n’otu mgbe ahụkwa na-arụ ọrụ nkwusa. Ọzọkwa, ọtụtụ n’ime unu na-arịa ọrịa, na-ada mbà n’obi, bụrụ ndị agadi, na ọbụna bụrụ ndị a na-emegide. Ọtụtụ n’ime unu bụ “ndị a na-ebogbu n’ibu.” Ọ ga-amasị anyị igosi mmetụta anyị nwere n’ebe unu nọ, dịkwa ka Jizọs kwuru, sị: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ na ndị a na-ebogbu n’ibu, m ga-emekwa ka unu nwee ume ọhụrụ.” (Mat. 11:28) Ọ ga-amasịkwa anyị ịja unu nile mma nke ukwuu bụ́ ndị tinyere mgbalị iji nọgide na-eji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi n’agbanyeghị ihe ịma aka nile unu na-eche ihu.
N’ụwa nile a na-eme mmadụ 4,762 baptizim kwa izu n’ihi ọrụ nkwusa na ọrụ izi ihe unu ji ịdị uchu na-arụ nakwa n’ihi ngọzi Jehova. N’ime afọ ije ozi gara aga, e guzobere ọgbakọ ọhụrụ dị 1,375. Anyị na-atụ anya ma na-ekpe ekpere na akwụkwọ ọhụrụ ahụ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?, bụ́ nke e nwere ugbu a n’ihe karịrị asụsụ 120, ga-enyere ọtụtụ nde mmadụ aka irite uru n’obiọma na-erughịrị mmadụ na udo nke sitere n’aka Jehova ‘n’ụbọchị nzọpụta’ a.
Jidenụ n’aka na Òtù Na-achị Isi hụrụ unu n’anya nakwa na anyị na-ekpe ekpere maka unu. Anyị na-ekelekwa unu maka ekpere unu na-ekpe maka anyị.
Ụmụnna unu,
Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova