Zere Ime Ihe Otú Ndị Ụwa Si Eme Ya
1 Otu n’ime ihe ndị e ji mara ụwa a bụ “oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ.” (1 Jọn 2:15-17) A na-ahụ nke a n’oriri agbamakwụkwọ ndị na-akpọtụ akpọtụ, bụ́ ndị a na-ahụkarị n’ụwa taa. E jizi alụmdi na nwunye akpa ego n’ụzọ dịgasị iche iche. Ọ dị mwute na ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst egosibeghị na ha dị iche n’ụwa site n’ụzọ ha si eme ememe alụmdi na nwunye ha.—Jọn 17:16; Rom 12:2.
2 Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ emeela ememe alụmdi na nwunye abụọ—nke omenala na nke Bekee—kpọọkwa oriri na nke ọ bụla n’ime ha. Nke a emeela ka agbamakwụkwọ na-erikwu oké ego. Isiokwu bụ́ “Alụmdi na Nwunye Dị Nsọpụrụ—Akụkụ nke Mbụ, Nke Omenala na nke Iwu Marriage Act,” bụ́ nke e bipụtara n’Ozi Alaeze Anyị nke October 1994, kwuru, sị: ‘Ọ dịwo mkpa ma kwesị ekwesị inye ihe ọmụma ụfọdụ banyere ụdị alụmdi na nwunye abụọ ndị anyị nwere n’obodo a, nke bụ́ alụmdi na nwunye dị ka iwu Marriage Act na alụmdi na nwunye Iwu Omenala ma ọ bụ nke ọdịnala si dị. Ụdị alụmdi na nwunye abụọ a zichara ezi, bụrụ ndị iwu kwadoro, na ndị dị nsọpụrụ. Ọgbakọ ndị Kraịst na-anakwere nke ọ bụla n’ime ha abụọ.’
3 Isiokwu bụ́ “Alụmdi na Nwunye Dị Nsọpụrụ—Akụkụ nke Abụọ; Nke Omenala na nke Iwu Marriage Act,” bụ́ nke e bipụtara n’Ozi Alaeze Anyị nke November 1994, kwukwara, sị: “N’ihi ihe ndị e kwuworo ugbu a nakwa n’ihi na ụdị [alụmdi na nwunye abụọ ahụ] zichara ezi, bụrụ ndị iwu kwadoro, ma dịkwa nsọpụrụ, ọ dị mkpa ikpebi n’ime ha abụọ nke a ga-eme. Ọ dịghị mkpa, ọ bụghịkwa ihe a chọrọ, ime ụdị abụọ a maka otu alụmdi na nwunye. Ị pụrụ ime alụmdi na nwunye gị n’okpuru iwu Marriage Act ma ọ bụkwanụ alụmdi na nwunye Iwu Omenala nke e dejupụtara n’akwụkwọ. Ebe ọ bụ na ịkwụ ụgwọ isi nwanyị n’onwe ya ezubeghị ma ọ bụ mee ka alụmdi na nwunye Iwu Omenala bụrụ nke iwu kwadoro ma ọ bụrụ na e nyefeghị nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ n’aka nwoke ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ, mgbe ahụ onye na-agbaso alụmdi na nwunye n’okpuru iwu Marriage Act pụkwara ịkwụ ụgwọ isi nwanyị n’etinyeghị aka n’ihe ndị ọzọ nke omenala chọrọ.”
4 Ka Ozi Alaeze Anyị nke October 1994, bụ́ nke a kpọtụrụ aha na mbụ, nọ na-ekwu okwu banyere alụmdi na nwunye nke iwu Marriage Act ma ọ bụ nke Bekee, o kwuru, sị: “Anyị na-agba mmadụ nile ume ịlụ ụdị alụmdi na nwunye a n’ihi na ọ na-enye nwunye ahụ na ụmụntakịrị nchebe ka ukwuu, tinyekwara abamuru ndị ọzọ ma ọ bụrụ na di ya anwụọ.” Uru ndị ọzọ alụmdi na nwunye Bekee ma ọ bụ nke iwu Marriage Act bara bụ inyere Onye Kraịst aka izere ụfọdụ omenala ndị ụwa bụ́ ndị pụrụ ime ka o nwee nsogbu n’ọgbakọ. Dị ka ihe atụ, n’oge a na-eme alụmdi na nwunye Bekee, nwoke bụ́ onye ụwa agaghị ekpe ekpere n’isi di na nwunye ọhụrụ ahụ n’ihi na ọ bụ nna nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ ma ọ bụ n’ihi na ọ bụ ya zụlitere ya. O mee ya, ọ ghọọla ngwakọta okpukpe. A pụkwara ikwu otu ihe ahụ banyere omenala ndị ọzọ Ndị Kraịst na-adịghị anabata.
5 N’ihi ihe ndị a e kwurula, ònye ka ọ dị n’aka ikpebi ụdị alụmdi na nwunye a ga-eme? Isiokwu bụ́ “Alụmdi na Nwunye Dị Nsọpụrụ—Akụkụ nke Atọ: Nke Omenala na nke Iwu Marriage Act” nke gbara n’Ozi Alaeze Anyị nke December 1994 kwuru na peeji nke 3, paragraf nke 1, sị: “Ma ndị nne na nna ma ndị ikwu adịghị nke ga-eme mkpebi dị otú ahụ. Ọ bụ ibu ọrụ dịịrị mmadụ abụọ ahụ nọ ná nkwa ọlụlụ ikpebi ụdị agbamakwụkwọ ha chọrọ, ma ọ̀ ga-abụ n’okpuru iwu Marriage Act ma ọ̀ bụ n’agbamakwụkwọ Iwu Omenala. Ọ dịghị onye nwere ikike ịmanye mmadụ abụọ ahụ nọ ná nkwa ọlụlụ ime otu ụdị agbamakwụkwọ ma ọ bụ nke ọzọ. Ha na-ebu ibu ọrụ nke ime mkpebi ahụ. Ha nwekwaara onwe ha ịhọrọ ebe a ga-anọ mee agbamakwụkwọ ahụ na, n’ọnọdụ nke agbamakwụkwọ n’okpuru iwu Marriage Act, onye [ga-ekwu] okwu agbamakwụkwọ ahụ.”
6 Dị ka e kwuru na paragraf nke ise, ebe ọ bụ na ọ bụghị ndị nne na nna ka ọ dị n’aka ikpebi ụdị alụmdi na nwunye a ga-eme, ọ dịghị mma ka kọmitii ije ozi na-esi ọnwụ na a ga-emezurịrị ihe nile omenala chọrọ tupu ha e kwere ka a nọrọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze gbaa akwụkwọ. Ihe bụ́ ọrụ kọmitii ije ozi bụ ịchọpụta ma mmadụ abụọ ahụ na-achọ ịgba akwụkwọ hà nwere aha ọma n’ọgbakọ. Ha ga-eme nke a site n’ịjụ kọmitii ije ozi nke ọgbakọ onye nke nwoke na onye nke nwanyị nọ na ya maka akwụkwọ ozi na-egosi ihe bụ́ ọnọdụ ha n’ọgbakọ.
7 Ọ bụrụ na ọ dị mkpa na a ga-akwụ ụgwọ isi nwanyị, ọ bụ nwoke ahụ na-alụ nwanyị na ndị ọgọ ya ka nke ahụ dị n’aka ma ọ bụrụ na ọ bụ alụmdi na nwunye Bekee ka nwoke ahụ chọrọ ime. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, a pụrụ iyi ụbọchị a ga-akwụ ụgwọ isi ahụ n’akpọghị oriri maka ya. Ihe mere anyị ji ekwu ya bụ na onye mere alụmdi na nwunye Bekee n’akwụghị ụgwọ isi nwanyị ejighị ụgwọ ọ bụla. N’ụzọ dị otú a, a pụrụ izere imefu oké ego n’ihi emeghị oriri abụọ—nke a ga-eme mgbe e mere alụmdi na nwunye n’ụzọ omenala na nke a ga-eme mgbe e mere nke Bekee.
8 Ihe ọzọ anyị chọrọ ikwu banyere ya bụ ọdịiche dị n’etiti ụzọ e si eme ndejupụta maka alụmdi na nwunye e mere n’ụzọ Omenala na nke e mere n’ụzọ ndị Bekee. Ọ bụrụ na e mebeghị alụmdi na nwunye n’ụzọ omenala, ịga n’ụlọ ọrụ ọchịchị ime obodo dejupụta akwụkwọ maka alụmdi na nwunye ọdịnala adịghị eme ka alụmdi na nwunye ahụ zie ezie, ọbụna ma a sị na akwụkwọ e dejupụtara yiri fọm a na-akpọ Form E, bụ́ nke a na-edejupụta n’alụmdi na nwunye Bekee. Biko rịba ama na ndejupụta e mere maka alụmdi na nwunye Bekee dị iche ná ndejupụta a na-eme maka nke ọdịnala. A dịghị atụ anya na mmadụ ga-emerịrị alụmdi na nwunye n’ụzọ Omenala tupu ya emewe nke Bekee. N’alụmdi na nwunye nke Bekee, ihe a chọrọ bụ, ụbọchị 21 tupu ụbọchị ndejupụta ahụ, ka nanị nwoke ahụ na-achọ ịlụ nwanyị ma ọ bụ nwanyị ahụ ọ na-achọ ịlụ ma ọ bụkwanụ ha abụọ degara ụlọ ọrụ na-edejupụta alụmdi na nwunye n’akwụkwọ akwụkwọ ozi. Ọ bụrụ na ụbọchị 21 ahụ agasịa, mmadụ abụọ ahụ chọrọ ịlụ onwe ha ga-aga n’ụlọ ọrụ na-edejupụta alụmdi na nwunye gaa gbata fọm a na-akpọ Form C iji nwee ike ịgba akwụkwọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ n’ebe ọzọ a na-anọ agba akwụkwọ bụ́ ebe ha ga-enweta fọm a na-akpọ Form E. Ọ bụ mgbe a bịanyere aka na fọm a a na-akpọ Form E, e werekwa ya nye nwoke na nwanyị ahụ, ka a na-ewere na mmadụ abụọ ahụ alụọla di na nwunye n’ụzọ Bekee ma ọ bụ n’ụzọ iwu Marriage Act. Ọ dịghị mkpa imekwasị ya alụmdi na nwunye ọdịnala. E kwesịghị ịghọta ndejupụta a dị ka nke a na-eme n’ebe ụfọdụ maka alụmdi na nwunye e mere n’ụzọ Omenala, otú ọ sọkwara fọm e nyere ya siri yie fọm a na-enye maka alụmdi na nwunye Bekee.
9 Ọ bụrụ na mmadụ ekpebie na ọ ga-alụ di ma ọ bụ nwunye n’ụzọ Omenala, o nweere onwe ya ime ya. Otú ọ dị, ka onye ahụ wee nweta ihe ùgwù ije ozi n’ọgbakọ, o kwesịrị ịga n’ụlọ ọrụ ọchịchị ime obodo dejupụta alụmdi na nwunye ahụ. O kwesịrị ime ka ndị na-arụ ebe ahụ mara na ọ chọrọ idejupụta alụmdi na nwunye o mere n’ụzọ Omenala, ha ga-enyekwa ya akwụkwọ na-egosi na alụmdi na nwunye o dejupụtara bụ nke e mecharala ihe dị na ya. Nanị onye nke nwoke pụrụ ịga mee ndejupụta ahụ, ma ọ bụkwanụ a pụrụ ịchọ ka ya na nwunye ya soro gaa mee ya. N’ebe ụfọdụ, ọ pụrụ ịdị mkpa ka nna nke nwanyị ma ọ bụ onye zụlitere ya nọrọ ya mgbe a na-eme ndejupụta ahụ.
10 Akwụkwọ a na-edejupụta n’otu ọchịchị ime obodo na-adị iche na nke a na-edejupụta na ọchịchị ime obodo ọzọ. Ma, tupu mmadụ agawa idejupụta alụmdi na nwunye ọdịnala, o kwesịrị ijide n’aka na ọ kwụọla ụgwọ isi nwanyị ahụ nakwa na a kpọnyela ya nwanyị ahụ. Ị pụghị idejupụta alụmdi na nwunye ọdịnala ma ọ bụrụ na e mebeghị omenala dị na ya.
11 Ọchịchị ime obodo ụfọdụ enweghị ụlọ ọrụ a na-edejupụta alụmdi na nwunye n’ụzọ omenala. Ya dị otú ahụ, ihe ị pụrụ ime bụ ịga na nke e nwere ụlọ ọrụ a na-edejupụta ya ma ọ bụkwanụ gị emee alụmdi na nwunye Bekee n’emeghị oriri ọzọ.
12 Obi siri anyị ike na ọ bụrụ na anyị ejiri nlezianya gbasoo ntụziaka ndị a, anyị ga-abụ ndị e chebekwuru pụọ n’omume nke ụwa.—Jọn 17:14, 16.