Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe n’ọnwa November: Nyefee akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ asị na ha enweghị ụmụaka, nyefee ha traktị bụ́ Ị̀ Ga-achọ Ịmatakwu Banyere Bible? ma ọ bụ traktị ọzọ dabara adaba. December: Nyefee akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. Ọ bụrụ na e nweghị ya, ị pụrụ inyefe Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible na Ị pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. January: A pụrụ inyefe akwụkwọ ọ bụla e bipụtara tupu 1991. Ọ bụrụ na ọgbakọ enweghị ya, a pụrụ inyefe akwụkwọ Ihe Ọmụma ma ọ bụ broshuọ bụ́ Nọrọ na Nche! February: A ga-enyefe akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso. Ọ bụrụ na ọgbakọ enweghị ya, a pụrụ inyefe akwụkwọ bụ́ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! ma ọ bụ akwụkwọ ọzọ merela ochie unu nwere n’ọgbakọ unu.