Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe n’ọnwa April na May: A ga-enyefe Ụlọ Nche na Teta! Mgbe ị na-eme nletaghachi na nke ndị nwere mmasị, nke gụnyere ndị bịara ihe omume e ji echeta ọnwụ Jizọs ma ọ bụ ndị bịara ya ma na-abịakwa nzukọ anyị ndị ọzọ ma ha adịghị eso ọgbakọ akpachi anya, gbalịsie ike inyefe ha akwụkwọ Bible Na-akụzi. Nzube anyị ji enyefe ha ya kwesịrị ịbụ iji ya duziwere ha ọmụmụ Bible. June: Nyefee akwụkwọ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ, ma ọ bụ akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ.
◼ A ga-edepụta ebe ndị a ga-enwe Mgbakọ Distrikti “Na-eso Kraịst!” nke 2007 n’otu n’ime Ozi Alaeze Anyị ndị a ka ga-ebipụta.
◼ Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ịhụ mgbe nile na ọgbakọ nwere fọm Application for Regular Pioneer Service (S-205) na nke Application for Auxiliary Pioneer Service (S-205b), ole ga-ezuru ha. A pụrụ iji fọm Literature Request Form (S-14) tụọ ọda ha. Hụ na ọgbakọ nwere, ọ dịkarịa ala, nke ga-ezu maka otu afọ. Tupu e zitere alaka ụlọ ọrụ fọm maka ọrụ ọsụ ụzọ oge nile, hụ na e dejupụtara ya nke ọma.
◼ Ọ dị mkpa ka alaka ụlọ ọrụ nwee ihe ndekọ kasị ọhụrụ nke adres na nọmba telifon nke ndị isi oche ndị nlekọta na ndị odeakwụkwọ nile. Ọ bụrụ na e nwee mgbanwe n’oge ọ bụla, Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ kwesịrị idejupụta fọm Presiding Overseer/Secretary Change of Address (S-29), bịanye aka na ya, ma zitere ya alaka ụlọ ọrụ ozugbo. Nke a na-agụnye mgbanwe ọ bụla e nwere na nọmba telifon.
◼ Mgbe ọ bụla ị na-eme atụmatụ ịga mba ọzọ ma na-atụ anya iso ndị ebe ahụ gaa nzukọ ọgbakọ, mgbakọ sekit, mgbakọ pụrụ iche, ma ọ bụ mgbakọ distrikti, ọ bụ alaka ụlọ ọrụ na-elekọta ọrụ ná mba ahụ ka ị ga-ajụ ajụjụ iji mata ụbọchị, oge, na ebe ndị a na-enwe nzukọ ma ọ bụ mgbakọ nke ọ bụla. E depụtara adres alaka ụlọ ọrụ dị iche iche na peeji ikpeazụ nke Yearbook kasị ọhụrụ.
◼ Isiokwu nke okwu ihu ọha pụrụ iche maka oge Ememe Ncheta nke afọ 2007 ga-abụ “Ị Pụrụ Ịnọ ná Nchebe n’Ụwa A Nsogbu Juru na Ya!” Lee Ozi Alaeze Anyị nke October 2006 maka ịma ọkwa yiri nke a.