“Obi Ụtọ Na-adịrị Onye Nọgidere Na-atachi Obi n’Ọnwụnwa”
1 Ọnwụnwa ga-abịara Ndị Kraịst nile. (2 Tim. 3:12) Ọnwụnwa nwere ike ịbịa n’ụdị ọrịa, ihe isi ike, ule, mkpagbu, ma ọ bụkwanụ n’ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ. Ọnwụnwa ndị Setan wetara bụ iji mee ka anyị daa mbà, iji mee ka anyị leghara ikwusa ozi Alaeze ahụ anya, ma ọ bụkwanụ iji mee ka anyị kwụsị ijere Chineke ozi. (Job 1:9-11) Olee otú ịnagide ọnwụnwa si ewetara anyị obi ụtọ?—2 Pita 2:9.
2 Kwadebe Onwe Gị Maka Ọnwụnwa: Jehova enyela anyị Okwu ya bụ́ Bible, bụ́ ebe e dekọrọ banyere ndụ Jizọs na ihe ndị ọ kụziri. Ọ bụrụ na anyị egee ntị n’ihe ndị Jizọs kụziri ma mee ha, anyị na-ewusi okwukwe anyị ike, sikwa otú ahụ na-akwadebe onwe anyị maka oge ọnwụnwa. (Luk 6:47-49) E nwekwara ihe ndị ọzọ na-eme ka anyị gbasie ike n’okwukwe—ha bụ, ụmụnna anyị, nzukọ ọgbakọ dịgasị iche iche, nakwa akwụkwọ ndị e ji amụ Bible bụ́ ndị òtù ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche na-ebipụta. Anyị ịdị na-ekpe ekpere mgbe nile, nke bụ́ onyinye sitere n’aka Chineke, na-emekwa ka anyị gbasie ike n’okwukwe.—Mat. 6:13.
3 Jehova emeekwala ka anyị nwee olileanya. Ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe siri ike ná nkwa ndị Jehova kwere anyị, olileanya anyị ga-aghọ “arịlịka maka mkpụrụ obi, bụ́ ma nke e ji n’aka ma nke guzosiri ike.” (Hib. 6:19) N’oge Bible, a sịgodị na oké ifufe anaghị efe, anaghị ekwe ka ụgbọ si n’ọdụ ụgbọ mmiri pụọ n’enweghị arịlịka e ji ejide ụgbọ. Ọ bụrụzie na oké ifufe abịa na mberede, ịtụba arịlịka ahụ n’ime mmiri nwere ike ime ka oké ifufe ghara iburu ụgbọ mmiri ahụ gawa n’ebe nkume juru. N’otu aka ahụkwa, ọ bụrụ na anyị emee ka okwukwe anyị nwere ná nkwa ndị Chineke kwere anyị sikwuo ike ugbu a, ọ ga-eme ka nsogbu ndị yiri oké ifufe ghara iburu anyị. Ọnwụnwa pụrụ ịbịa na mberede. Ọ bụ eziokwu na ndị Listra nabatara ozi ọma Pọl na Banabas na mbụ, ọnọdụ gbanwere n’otu ntabi anya mgbe ndị mmegide bụ́ ndị Juu bịara.—Ọrụ 14:8-19.
4 Ntachi Obi Na-eweta Obi Ụtọ: Ịnọgide na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị mmegide na-eme ka obi ruo anyị ala. Anyị na-aṅụrị ọṅụ mgbe ọ bụla a gụrụ anyị ná ndị ruru eru ịbụ ndị a ga-emenye ihere n’ihi aha Kraịst. (Ọrụ 5:40, 41) Ịtachi obi n’ule na-enyere anyị aka inwekwu àgwà ndị dị ka umeala n’obi, nrubeisi, na ntachi obi. (Deut. 8:16; Hib. 5:8; Jems 1:2, 3) Ọ na-akụziri anyị ịtụkwasị Jehova obi, inwe obi ike na ọ ga-emezu nkwa ya, na ịgbaba n’ime ya.—Ilu 18:10.
5 Anyị maara na ọnwụnwa na-adịru nwa oge. (2 Kọl. 4:17, 18) Ọnwụnwa na-enye anyị ohere igosi otú anyị hụruru Jehova n’anya. Ọ bụrụ na anyị atachie obi n’ọnwụnwa, anyị na-egosi na ihe Setan kwuru banyere anyị abụghị eziokwu. N’ihi ya, ka anyị ghara ịda mba! Bible kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị onye nọgidere na-atachi obi n’ọnwụnwa, n’ihi na n’ịbụ onye a nwapụtara, ọ ga-anata okpueze bụ́ ndụ.”—Jems 1:12.