Ntụleghachi A Ga-eme n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu ga-amalite n’August 27, 2007. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi ga-ewe nkeji iri atọ nke ga-adabere n’ihe ndị a tụlere n’ihe omume ndị e mere n’izu July 2 ruo August 27, 2007.
NKÀ OKWU
1. Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị na-akwanyere ndị anyị na-ezi ozi ọma na ndị na-ege anyị ntị mgbe anyị na-ekwu okwu n’ọgbakọ ùgwù? [be-IB p. 192 para. 2-4]
2. Olee ihe ọ dị mkpa ka anyị mee iji gosi na anyị kwenyere n’ihe anyị na-ekwu? [be-IB p. 196 para. 1-3]
3. Olee ụfọdụ aro ndị ga-enyere anyị aka ịdị akọ mgbe anyị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma? [be-IB p. 198 para. 1-5]
4. Olee otú ịdị akọ si agụnye ịma oge kwesịrị ekwesị iji kwuo ihe ụfọdụ mgbe anyị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma? (Ilu 25:11) [be-IB p. 199 para. 1-3]
5. Olee otú anyị pụrụ isi mee ka okwu anyị na-ewuli ndị ọzọ elu? [be-IB p. 203 para. 2–p. 204 para. 1]
IHE OMUME NKE 1
6. Gịnị bụ akụkụ anọ bụ́ isi nke ọhụụ Ezikiel? [w99 3/1 p. 8 para. 3]
7. Olee otu àgwà ọ dị oké mkpa ka mmadụ nwee iji nagide ikpe na-ezighị ezi? [w05 6/1 p. 29 para. 4]
8. Gịnị ka anyị na-amụta n’otú Jizọs si zaghachi mgbe ndị Sadusii jụrụ ya ajụjụ banyere mbilite n’ọnwụ? (Luk 20:37, 38) [be-IB p. 66 para. 4]
9. Mgbe onye ị na-amụrụ Bible ma ọ bụ onye kwere ekwe ibe gị jụrụ gị ihe ọ ga-eme banyere otu ọnọdụ dapụtaranụ, olee otú i kwesịrị isi zaghachi? [be-IB p. 69 para. 4-5]
10. Gịnị ka ‘ime ka ị dị ọhụrụ n’ikike nke na-akwali uche gị’ na-agụnye? (Efe. 4:23) [be-IB p. 74 para. 4]
ỌGỤGỤ BIBLE DỊỊRỊ IZU
11. N’Ezikiel 9:2-4, ònye ka nwoke ahụ yi uwe mwụda ọcha na-anọchi anya ya, gịnịkwa ka ‘ịka akara n’egedege ihu’ na-egosi? [w88 9/15 p. 14 para. 18]
12. Olee otú ndị ndú okpukpe Krisendọm si yie “ndị amụma nzuzu [bụ́] ndị [jesoro] mmụọ nke ha,” dị ka e si kọwaa ha n’Ezikiel 13:3? [w99 10/1 p. 13]
13. Mgbe ụmụ Izrel ‘tụrụ ilu’ ahụ e dekọrọ n’Ezikiel 18:2, olee ihe ha nọ na-agbalị ime, oleekwa ihe nke a na-akụzi banyere onye ọ bụ ya ga-aza ajụjụ maka àgwà onye ọ bụla n’ime anyị na-akpa? [w88 9/15 p. 18 para. 10]
14. Olee otú o si bụrụ na Ezikiel ‘dara ogbi’ n’oge a nọchibidoro Jeruselem n’agha ma bibie ya? (Ezik. 24:27; 33:22) [w03 12/1 p. 29]
15. Ònye bụ “Gọg nke ala Megọg,” oleekwa mgbe ọ ga-aga ibibi ndị Jehova? (Ezik. 38:2, 16) [w97 3/1 p. 14 para. 1-p. 15 para. 3]