Gosi na I Nwere Obi Ekele Maka Ndokwa Jehova Mere Iji Nyere Gị Aka Ịmụta Otú E Si Agụ na Otú E Si Ede
1 Klas a na-amụ otú e si agụ na otú e si ede n’ọgbakọ bụ ngalaba nke Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. E hiwere ya iji nyere ndị nkwusa na ndị nwere mmasị aka bụ́ ndị na-amaghị otú e si agụ na otú e si ede ka ha mụta ime otú ahụ. Na Nigeria, ọtụtụ puku mmadụ egosila na ha nwere obi ekele maka ndokwa a. Ha amụtala ịgụ ihe nke ọma, na-akụzikwa Okwu Chineke nke ọma karịa otú ha na-emebu. Ọ bụrụ na ị maghị otú e si agụ na otú e si ede, ọ bụrụkwa na e nwere klas ebe a na-amụ otú e si agụ na otú e si ede n’ọgbakọ unu, ị̀ ga-egosi na i nwere obi ekele maka ndokwa a? Olee otú ị pụrụ isi mee nke a?
2 Denye Aha Gị, Gosikwa na I Nwere Ezi Mmasị: Ọ bụrụ na ị maghị otú e si agụ na otú e si ede, i kwesịrị idenye aha gị na klas ebe a na-amụ otú e si agụ na otú e si ede. Ekwela ka ihere ma ọ bụ nganga gbochie gị ime otú ahụ. (Tụlee 2 Ndị Eze 5:10-14.) Ozugbo e denyere aha gị, jiri ọmụmụ ihe gị kpọrọ ihe. (Ilu 21:5) Ihe nke a chọrọ n’aka gị bụ ịbịa n’oge, ige ntị mgbe a na-akụzi ihe na klas, na inwe mmasị nke ukwuu n’ịmụta ihe. Ọ bụrụ na e nye gị ihe omume ị ga-eme n’ụlọ, mezie ya emezie—gụọ ihe unu ga-amụ na klas n’oge ọzọ, mụgharịakwa ya. Ndị a bụ ụzọ ụfọdụ ị ga-esi gosi na i nwere obi ekele maka klas ahụ Jehova dokwara.
3 Were Ihe Nile Unu Ji Amụ Ihe: Nwa akwụkwọ kwesịrị inwe ihe ndị o ji amụ ihe. Ya mere, mgbe ọ bụla ị na-aga klas ebe a na-amụ otú e si agụ na otú e si ede, i kwesịrị iji mkpịsị akwụkwọ ma ọ bụ pensụl, Bible, akwụkwọ e ji ede ihe, na akwụkwọ ọ bụla ọzọ ma ọ bụ broshuọ unu ji amụ ihe. Ọ bụrụ na ị na-ejizucha ihe ndị a, ị ga-erite uru karị ná ndokwa a. Ọ ga-egosikwa na i nwere obi ekele maka ndokwa Jehova mere.
4 Echefula Ebumnobi Gị: Malite n’oge ochie ruo taa, Jehova chọrọ ka ndị ohu ya mara otú e si agụ ihe na otú e si ede ihe nke ọma, n’agbanyeghị ọnọdụ ha ná ndụ, ka ha wee na-erite uru nke ukwuu n’Okwu ya. (Josh. 1:8; Deut. 6:8, 9; 17:18, 19) Ya mere, isi ihe mere i ji denye aha na klas ahụ bụ ka i nwee ike ịgụ Okwu Chineke, na-akọwakwa ya nke ọma ka o doo anya, ka i wee na-eto eto n’ụzọ ime mmụọ, na-enyekwara ndị ọzọ aka ịghọta ozi Alaeze ahụ. Ọ bụrụ na ị na-echeta ebumnobi a, ọ ga-akpali gị idi ihe ịma aka nile dị n’ịmụ otú e si agụ na otú e si ede.
5 Ịmị Mkpụrụ Alaeze: Jehova na Ọkpara ya chọrọ ka anyị na-amị mkpụrụ nke Alaeze. (Jọn 15:8) Otú ọ dị, otu ihe ga-enyere gị aka nke ukwuu iji mee nke a bụ ịmụta otú e si agụ na otú e si ede. Tụlee ahụmahụ a: Otu nwanna nwoke nke na-amaghị otú e si agụ na otú e si ede nọ na-aga ozi ụlọ ruo n’ụlọ na nke mbụ ya. Otu nwoke Protestant nke hụrụ na ọ maghị agụ ihe sịrị ya: ‘Abịala izi m ozi ọma ruo mgbe i nwere ike ịgụ Bible n’onwe gị.’ Ọ bụ ezie na onye nkwusa ọhụrụ ahụ gbalịrị ịgwakwu nwoke ahụ okwu, o geghị ya ntị. O kwuru ọzọ na onye na-amaghị otú e si agụ na otú e si ede enweghị ike ịkụzi ihe ọ bụla. Onye nkwusa ahụ kpebiri na ya ga-amụta otú e si agụ na otú e si ede. Ọ bụghị nanị na ọ gawara klas ebe a na-amụ otú e si agụ na otú e si ede, kamakwa, ọ mụwara ihe kwa ụbọchị ruo izu isii. Ebe ọ bụla ọ na-aga, ọ na-ewere akwụkwọ ya, na-arịọ ndị maara otú e si agụ ihe ka ha kpọpụtara ya okwu ọ na-amaghị. Gịnị meziri? Mgbe izu isii gasịrị, ọ gara ozi ubi ọzọ, gaghachi na nke nwoke ahụ jụrụ ige ntị n’ụbọchị mbụ ahụ ọ malitere ikwusa ozi ọma. Ọ bụghị nanị na o juru nwoke Protestant ahụ anya n’oge a na nwanna a nke na-amabughị otú e si agụ na otú e si ede na-agụrụ ya Bible, kamakwa, o nwere mmasị n’ihe ọ kụziiri ya. Ịmụta otú e si agụ na otú e si ede, jirikwa ya na-akụziri ndị ọzọ eziokwu ahụ, bụ ụzọ mara mma anyị si egosi na anyị nwere obi ekele maka ndokwa Jehova mere.—Mat. 24:14; 28:19, 20; Jọn 8:32; 17:3.
6 Nwee Obi Ike: Taa, ọtụtụ ndị torola eto na-atụ ụjọ idenye aha ha na klas ebe a na-amụ otú e si agụ na otú e si ede. O yikwara ka ụfọdụ ndị denyere aha ha ekweghị na ọ dị mgbe ha ga-amụta otú e si agụ na otú e si ede. Otú ọ dị, ọ bụrụ na i nwee okwukwe n’okwu na-emesi obi ike Jizọs kwuru na Matiu 17:20, ị ga-enwe ike imeri nsogbu a yiri ugwu. Ya mere, mee ka obi gị dịrị n’ihe ị na-amụ na klas ahụ. Tinye obi gị dum n’ihe unu na-amụ n’ụlọ akwụkwọ ahụ. Ka Jehova hụ mgbali i ji obi gị na-eme ịmụta otú e si agụ na otú e si ede. Ka ọ gọziekwa gị site n’ime ka ị mụta ya. Otu nwanna nwoke nke na-amaghị otú e si agụ na otú e si ede, bụ́ onye denyere aha ya na klas ahụ n’ọgbakọ ya, nwere ọganihu nke na o mesịrị ghọọ onye na-akụzi ihe na klas ahụ n’ọgbakọ ya! N’eziokwu, “n’ebe Chineke nọ ihe nile kwere omume.” (Mat. 19:26) Ọ bụrụ na ị tụkwasị obi na Jehova, meekwa mgbalị i kwesịrị ime, n’oge na-adịghị anya, ị ga-aghọ otu n’ime ọtụtụ ndị gosiri na ha nwere obi ekele maka klas a Jehova dokwara, bụ́ ndị mụtara otú e si agụ na otú e si ede ugbu a.