Ịma Ọkwa
◼ October: Nyefee magazin Ụlọ Nche na Teta! N’ebe e gosiri mmasị, nyefee ha traktị bụ́ Ị̀ Ga-achọ Ịmatakwu Banyere Bible? Gị na ha kwurịta ihe dị na ya ka i wee malite iduziri ha ọmụmụ Bible. November: A ga-enyefe akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ asị na ha enweghị ụmụaka, nyefee ha broshuọ bụ́ Nọrọ na Nche! December: Nyefee akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. Ọ bụrụ na e nweghị ya, nyefee akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso ma ọ bụ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. January: E nwere ike inyefe akwụkwọ ọ bụla e bipụtara tupu afọ 1991 ma ọ bụ akwụkwọ ochie ọ bụla ọzọ e nwere n’ọgbakọ. Akwụkwọ ọzọ e nwere ike inyefe: Akwụkwọ Ihe Ọmụma ma ọ bụ broshuọ bụ́ Nọrọ na Nche!
◼ Ebe ọ bụ na a ga-enwe ngwụsị izu ise zuru ezu n’ọnwa December, ọ ga-abụ ọnwa magburu onwe ya ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka.
◼ A ga-atụle vidio bụ́ Transfusion-Alternative Health Care—Meeting Patient Needs and Rights n’otu n’ime Nzukọ Ije Ozi ndị a ga-enwe n’ọnwa January. Onye chọrọ ya kwesịrị isi n’aka ọgbakọ ya tụọ ọda ya ngwa ngwa o kwere omume.
◼ Ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke ọnwa a bụ “Usoro Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 2008.” E kwesịrị ichekwa ya ka e jiri ya na-achọta ihe omume ndị a ga-eme n’ime afọ 2008 dum.
◼ Biko maranụ na ọ bụ nwanna e kenyere ihe omume nke ikpeazụ ná Nzukọ Ije Ozi kwesịrị ịkpọ abụ mmechi. A bụsịa abụ, ọ bụ ya ga-ekpe ekpere mmechi, ma ọ bụkwanụ nwanna ọzọ ruru eru e kenyere ya tupu oge eruo.
◼ Ihe òtù ndị okenye ga-eburu n’uche: Ọ bụ nanị ná mbipụta Bekee nke Ozi Alaeze Anyị nke October 2007 ka e kwuru otú a ga-esi ekesa Teta! Bekee pụrụ iche nke November.